< 列王記Ⅱ 20 >

1 當時ヒゼキヤ病て死なんとせしことありアモツの子預言者イザヤ彼の許にいたりて之にいひけるはヱホバかく言たまふ汝家の人に遺命をなせ汝は死ん生ることを得じと
Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma nwa Emọz bịakwutere ya sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”
2 是においてヒゼキヤその面を壁にむけてヱホバに祈り
Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ, kpee ekpere nye Onyenwe anyị, sị,
3 嗚呼ヱホバよ願くは我が眞實と一心をもて汝の前にあゆみ汝の目に適ふことを行ひしを記憶たまへと言て痛く泣り
“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.
4 かくてイザヤ未だ中の邑を出はなれざる間にヱホバの言これに臨みて言ふ
Tupu Aịzaya esite nʼetiti ogige ụlọeze pụọ, okwu nke Onyenwe anyị rutere ya ntị, sị ya:
5 汝還りてわが民の君ヒゼキヤに告よ汝の父ダビデの神ヱホバかく言ふ我汝の祈祷を聽り汝の涙を看たり然ば汝を愈すべし第三日には汝ヱホバの家に入ん
“Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
6 我汝の齢を十五年増べし我汝とこの邑とをアッスリヤの王の手より救ひ我名のため又わが僕ダビデのためにこの邑を守らんと
Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị. Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a nʼihi mụ onwe m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’”
7 是に於てイザヤ乾無花果の団塊一箇を持きたれと言ければすなはち之を持きたりてその腫物に貼たればヒゼキヤ愈ぬ
Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ.” Ha mere nke a, teekwasị ya nʼelu etuto ahụ, ahụ dịkwara ya mma.
8 ヒゼキヤ、イザヤに言けるはヱホバが我を愈したまふ事と第三日に我がヱホバの家にのぼりゆく事とにつきては何の徴あるや
Mgbe ahụ, Hezekaya jụrụ Aịzaya sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na Onyenwe anyị ga-agwọ m, na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nʼụbọchị nke atọ na-abịa nʼihu?”
9 イザヤ言けるはヱホバがその言しところを爲たまはん事につきては汝ヱホバよりこの徴を得ん日影進めること十度なり若日影十度退かば如何
Aịzaya zara, “Nke a bụ ihe ama Onyenwe anyị nye gị na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kwere na nkwa. Ị chọrọ ka onyinyo a gaa nʼihu ihe nrigo iri, ka ọ bụ ka ọ laa azụ ihe nrigo iri?”
10 ヒゼキヤ答へけるは日影の十度進むは易き事なり然せざれ日影を十度しりぞかしめよ
Hezekaya zara sị, “Ọ dị mfe ka onyinyo gaa nʼihu nzọ ụkwụ iri. Ma mee ka onyinyo a laa azụ ihe nrigo iri.”
11 是において預言者イザヤ、ヱホバに龥はりければアハスの日晷の上に進みし日影を十度しりぞかしめたまへり
Mgbe ahụ, Aịzaya, onye amụma rịọrọ Onyenwe anyị ka o meere Hezekaya nke a. Onyenwe anyị mekwara ka onyinyo laghachi azụ ihe nrigo iri dịka o si gbada nʼihe nrigo ụlọ Ehaz.
12 その頃バラダンの子なるバビロンの王メロダクバラダン書および禮物をヒゼキヤにおくれり是はヒゼキヤの疾をるを聞たればなり
Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa.
13 ヒゼキヤこれがために喜びその寶物の庫金銀香物貴き膏および武器庫ならびにその府庫にあるところの一切の物を之に見せたりその家にある物もその國の中にある物も何一箇としてヒゼキヤが彼等に見せざる者はなかりき
Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ gosi ha ihe niile dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ na ezigbo mmanụ oliv, ụlọ ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.
14 茲に預言者イザヤ、ヒゼキヤ王のもとに來りてこれに言けるは夫の人々は何を言しや何處より來りしやヒゼキヤ言けるは彼等は遠き國より即ちバビロンより來れり
Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si, ha si Babilọn.”
15 イザヤ言ふ彼等は汝の家にて何を見しやヒゼキヤ答へて云ふ吾家にある物は皆かれら之を見たり我庫の中には我がかれに見せざる者なきなり
Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?” Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.”
16 イザヤすなはちヒゼキヤに言けるは汝ヱホバの言を聞け
Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị.
17 ヱホバ言たまふ視よ日いたる凡て汝の家にある物および汝の先祖等が今日までに積蓄へたる物はバビロンに携ゆかれん遺る者なかるべし
Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
18 汝の身より出る汝の生んところの子等の中を彼等携へ去ん其等はバビロンの王の殿において官吏となるべし
A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.”
19 ヒゼキヤ、イザヤに言ふ汝が語れるヱホバの言は善し又いふ若わが世にある間に大平と眞實とあらば善にあらずや
Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụ na udo na nchekwa agaghị adị nʼoge ndụ m?”
20 ヒゼキヤのその餘の行爲その能およびその池塘と水道を作りて水を邑にひきし事はユダの王の歴代志の書にしるさるるにあらずや
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, ọrụ niile ọ rụrụ, tinyere ọdọ mmiri o gwuru, na olulu ọwa mmiri na-aga o gwuru, nke o ji webata mmiri nʼime obodo, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
21 ヒゼキヤその先祖等とともに寝りてその子マナセこれに代りて王となれり
Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

< 列王記Ⅱ 20 >