< サムエル記Ⅰ 11 >

1 アンモニ人ナハシ、ギレアデのヤベシにのぼりて之を圍むヤベシの人々ナハシにいひけるは我らと約をなせ然らば汝につかへん
Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn, duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.”
2 アンモニ人ナハシこれに答へけるは我かくして汝らと約をなさん即ち我汝らの右の目を抉りてイスラエルの全地に恥辱をあたへん
Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.”
3 ヤベシの長老これにいひけるは我らに七日の猶予をあたへて使をイスラエルの四方の境におくることを得さしめよ而して若し我らを救ふ者なくば我ら汝にくだらん
Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”
4 斯て使サウルのギベアにいたり此事を民の耳に告しかば民皆聲をあげて哭きぬ
Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa.
5 爰にサウル田より牛にしたがひて來るサウルいひけるは民何によりて哭くやと人々これにヤベシ人の事を告ぐ
Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.
6 サウル之を聞るとき神の霊これに臨みてその怒甚だしく燃えたち
Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu.
7 一軛の牛をころしてこれを切り割き使の手をもてこれをイスラエルの四方の境にあまねくおくりていはしめけるは誰にてもサウルとサムエルにしたがひて出ざる者は其牛かくのごとくせらるべしと民ヱホバを畏み一人のごとく均くいでたり
Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.” Onyenwe anyị mere ka egwu jide ndị Izrel niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ.
8 サウル、ベゼクにてこれを數ふるにイスラエルの子孫三十萬ユダの人三萬ありき
Mgbe Sọl kpọkọtara ha na Bezek, ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na Juda.
9 斯て人々來れる使にいひけるはギレアデのヤベシの人にかくいへ明日日の熱き時汝ら助を得んと使かへりてヤベシ人に告げければ皆よろこびぬ
Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu.
10 是をもてヤベシの人云けるは明日汝らに降らん汝らの善と思ふところを爲せ
Ndị ikom Jebesh ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.”
11 明日サウル民を三隊にわかち暁更に敵の軍の中にいりて日の熱くなる時までアンモニ人をころしければ遺れる者は皆ちりぢりになりて二人倶にあるものなかりき
Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara.
12 民サムエルにいひけるはサウル豈我らの王となるべけんやと言しは誰ぞや其人を引き來れ我ら之をころさん
Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!”
13 サウルいひけるは今日ヱホバ救をイスラエルに施したまひたれば今日は人をころすべからず
Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!”
14 茲にサムエル民にいひけるはいざギルガルに往て彼處にて王國を新にせんと
Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.”
15 民みなギルガルにゆきて彼處にてヱホバのまへにサウルを王となし彼處にて酬恩祭をヱホバのまへに献げサウルとイスラエルの人々皆かしこにて大に祝へり
Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja udo nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.

< サムエル記Ⅰ 11 >