< 歴代誌Ⅰ 27 >

1 イスラエルの子孫すなはち宗家の長千人の長百人の長およびその有司等は年の惣の月のあひだ月ごとに更り入り更り出で其班列の諸の事をつとめて王に事へたるが其數を按ふるに一班列に二萬四千人ありき
Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ.
2 先第一の班列すなはち正月の分はザブデエルの子ヤシヨベアムこれを率ゆ其班列は二萬四千人
Ndị a bụ aha ọchịagha na-achị ndị agha nʼọnwa ọbụla. Onyeisi nkewa nke mbụ, maka ọnwa nke mbụ bụ Jashobeam nwa Zabdiel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
3 彼は正月の軍團の長等の首たる者にしてペレヅの子孫なり
O si nʼikwu Perez nke dị nʼebo Juda, ọ bụ onyeisi ndịisi agha nke ọnwa mbụ.
4 二月の班列はアホア人ドダイその班列の者とともにこれを率ゆミクロテといふ宰あり其班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke abụọ, maka ọnwa nke abụọ bụ Dodayi, nwa Ahohi bụ onyeisi agha nkewa nke abụọ. Miklot bụ onyendu otu a, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa a bụ iri puku abụọ na anọ.
5 三月の軍團を統る第三の將は祭司の長ヱホヤダの子ベナヤその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
6 このベナヤはかの三十人の中の勇士にして三十人の上にたてり彼の子アミザバデその班列にあり
Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a.
7 四月の分を統る第四の將はヨアブの弟アサヘルにしてその子ゼバデヤこれに次り其班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ. Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ.
8 五月の分を統る第五の將はイズラヒ人シヤンモテその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
9 六月の分を統る第六の將はテコア人イツケシの子イラその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
10 七月の分を統る第七の將はエフライムの子孫たるペロニ人ヘレヅその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke asaa, maka ọnwa nke asaa bụ Helez onye Pelon. Onye sitere nʼikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
11 八月の分を統る第八の將はゼラの子孫たるホシヤ人シベカイその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke asatọ, maka ọnwa nke asatọ bụ Sibekai onye Husha. Onye sitere nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
12 九月の分をすぶる第九の將はベニヤミンの子孫たるアナトテ人アビエゼルその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
13 十月の分をすぶる第十の將はゼラの子孫たるネトパ人マハライその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke iri, maka ọnwa nke iri bụ Maharai onye Netofa, site nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
14 十一月の分をすぶる第十一の將はエフライムの子孫たるピラトン人ベナヤその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
15 十二月の分を統る第十二の將はオテニエルの子孫たるネトパ人ヘルダイその班列は二萬四千人
Onyeisi nkewa nke iri na abụọ, maka ọnwa nke iri na abụọ bụ Heldai onye Netofa. Onye sitere nʼezinaụlọ Otniel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ.
16 イスラエルの支派を治むる者は左のごとしルベン人の牧伯はヂクリの子エリエゼル、シメオンの牧伯はマアカの子シバテヤ
Ndị a bụ ndị ndu ebo Izrel niile: Elieza nwa Zikri bụ onyendu ndị Ruben; Shefataya nwa Maaka bụ onyendu ndị Simiọn;
17 レビ人の牧伯はケムエルの子ハシヤビヤ、アロン人の牧伯はザドク
Hashabaya nwa Kemuel bụ onyendu ndị Livayị; Zadọk bụ onyendu ụmụ Erọn;
18 ユダの牧伯はダビデの兄弟エリウ、イツサカルの牧伯はミカエルの子オムリ
Elihu nwanne Devid bụ onyendu ndị Juda; Omri nwa Maikel bụ onyendu ndị Isaka;
19 ゼブルンの牧伯はオバデヤの子イシマヤ、ナフタリの牧伯はアズリエルの子ヱレモテ
Ishmaya nwa Ọbadaya bụ onyendu ndị Zebụlọn; Jerimot nwa Azriel bụ onyendu ndị Naftalị;
20 エフライムの子孫の牧伯はアザジヤの子ホセア、マナセの半支派の牧伯はペダヤの子ヨエル
Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem; Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase;
21 ギレアデなるマナセのご半支派の牧伯はゼカリヤの子イド、ペニヤミンの牧伯はアブネルの子ヤシエル
Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead; Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin;
22 ダンの牧伯はヱロハムの子アザリエル、イスラエルの支派の牧伯等は是のごとし
Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile.
23 二十歳以下なる者はダビデこれを數へざりき其はヱホバかつてイスラエルを増て天空の星のごとくにせんと言たまひしことあればなり
Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe.
24 ゼルヤの子ヨアブ數ふることを始めたりしがこれを爲をへざりきそのかぞふることによりて震怒イスラエルにおよべりその數はまたダビデ王の記録の籍に載ざりき
Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.
25 アデエルの子アズマウテは王の府庫を掌どりウジヤの子ヨナタンは田野邑々村々城などにある府庫を掌どり
Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze. Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile.
26 ケルブの子エズリは地を耕す農業の人を掌どり
Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya.
27 ラマテ人シメイは葡萄園を掌どりシフミ人ザブデはその葡萄園より取る葡萄酒の蔵を掌どり
Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha.
28 ゲデラ人バアルハナンは平野なる橄欖樹と桑樹を掌どりヨアシは油の蔵を掌どり
Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel. Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv.
29 シヤロン人シテナイはシヤロンにて牧ふ牛の群を掌どりアデライの子シヤバテは谷々にある牛の群を掌どり
Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn. Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu.
30 イシマエル人オビルは駱駝を掌どりメロノテ人ヱデヤは驢馬を掌どり
Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze. Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu.
31 ハガリ人ヤジズは羊の群を掌どれり是みなダビデ王の所有を掌どれる者なり
Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ. Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere.
32 またダビデの叔父ヨナタンは議官たり彼は智慧あり學識ある者なり又ハクモニの子ヱヒエルは王の子等の補佐たり
Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ. Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom.
33 アヒトペルは王の議官たりアルキ人ホシヤイは王の伴侶たり
Ahitofel bụ onye na-adụ eze ọdụ. Hushaị onye Akai bụ enyi eze.
34 アヒトペルに次ぐ者はベナヤの子ヱホヤダおよびアビヤタル王の軍旅の長はヨアブ
Mgbe Ahitofel nwụrụ, Jehoiada nwa Benaya na Abịata nọchiri anya ya. Joab bụ ọchịagha igwe ndị agha eze.

< 歴代誌Ⅰ 27 >