< Abụ nke Abụ 6 >

1 Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? Olee ụzọ o sitere? Ka anyị soro gị chọọ ya.
Where has your beloved gone, you fairest amongst women? Where has your beloved turned, that we may seek him with you?
2 Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili.
My beloved has gone down to his garden, to the beds of spices, to pasture his flock in the gardens, and to gather lilies.
3 Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.
I am my beloved’s, and my beloved is mine. He browses amongst the lilies.
4 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ. Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.
You are beautiful, my love, as Tirzah, lovely as Jerusalem, awesome as an army with banners.
5 Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
Turn away your eyes from me, for they have overcome me. Your hair is like a flock of goats, that lie along the side of Gilead.
6 Eze gị dị ka igwe atụrụ nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.
Your teeth are like a flock of ewes, which have come up from the washing, of which every one has twins; not one is bereaved amongst them.
7 Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.
Your temples are like a piece of a pomegranate behind your veil.
8 E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,
There are sixty queens, eighty concubines, and virgins without number.
9 ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. Naanị otu nwanyị nne ya nwere, ọ masịrị onye mụrụ ya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.
My dove, my perfect one, is unique. She is her mother’s only daughter. She is the favourite one of her who bore her. The daughters saw her, and called her blessed. The queens and the concubines saw her, and they praised her.
10 Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ, nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ, dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?
Who is she who looks out as the morning, beautiful as the moon, clear as the sun, and awesome as an army with banners?
11 Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi, ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu, ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị, na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.
I went down into the nut tree grove, to see the green plants of the valley, to see whether the vine budded, and the pomegranates were in flower.
12 Tupu m mata ebe m nọ, agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.
Without realising it, my desire set me with my royal people’s chariots.
13 Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ; laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya. Onye hụrụ ibe ya nʼanya Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?
Return, return, Shulammite! Return, return, that we may gaze at you. Lover Why do you desire to gaze at the Shulammite, as at the dance of Mahanaim?

< Abụ nke Abụ 6 >