< Abụ nke Abụ 4 >

1 Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya, e, ị mara mma! Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead. 2 Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ, nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha. 3 Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie. Ọnụ gị dị mma ile anya. Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ. 4 Olu gị dị ka ụlọ elu Devid, nke e wuziri nke ọma. E konyere puku ọta na ya, ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha. 5 Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi. 6 Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi. 7 Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ ọbụla dị gị nʼahụ. 8 Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi. 9 I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m. 10 Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, isisi ụtọ nke mmanụ otite gị na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla. 11 Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn 12 Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa. 13 Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad, 14 naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ. 15 I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata. 16 Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu; bịakwa gị ifufe si na ndịda, fekwasị ubi m a gbara ogige, ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile, ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige, ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.

< Abụ nke Abụ 4 >