< Mkpughe 20 >

1 Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. (Abyssos g12)
Kabhele nabhwene malaika iselela kuhoma kumbinguni, ajhe ni lufungulu lwa mu lilende lya libelikujha ni mwishu ni minyororo mibhaha mu mabhoko gha muene. (Abyssos g12)
2 O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ.
Alikamuili lijhoka lela, lijhoka lya muandi, ambajhe ndo ibilisi au lisyetani ni kun'konga miaka elfu.
3 Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge. (Abyssos g12)
An'taghiti mu lil'ende lyalibelikujha ni mwishu akalikonga ni kulisopa muhuri panani pa muene. Ejhe jhajhele naha ili kwamba asibhakofi mataifa kabhele mpaka miaka elfu pajhibeta kumalika. Baada jha hapu ibeta kulekesibhwa huru kwa muda udebe. (Abyssos g12)
4 Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ.
Kabhele nabhwene fiti fya enzi. Bhajhele bhafitamili bhala ambabho bhapelibhu mamlaka gha kuhukumu. Kabhele nabhwene nafasi jha bhala ambabho bhadumulibhu mitu kwandabha jha ushuhuda bhwa kuhusu Yesu ni kwa lilobhi lya K'yara. Bhajhele bhabeli kumwabudu mnyama au sanamu jha muene, na bhabelili kupokela alama panani pa mihu pa bhene au kibhoko. Bhahidili mu uzima, na bhatawala pamonga ni Kristu kwa miaka elfu.
5 Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.
Bhafu bhabhabakili bhahidilepi mu uzima mpaka miaka elfu bho jhimaliki. Obho ndo ufufuo bhwa kuanza.
6 Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nʼọnwụ nke mbụ ahụ. Ọnwụ nke abụọ enweghị ike nʼebe ha nọ, nʼihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa ọchịchị puku afọ.
Mbarikibhwa ni mtakatifu ndo munu jhejhioha ambajhe itola nafasi mu ufufuo bhwa kuanza! Mauti gha pili ijhelepi ni nghofu panani pa bhanu kama abha. Pibeta kujha ni makuhani bha K'yara ni bha Kristu na bhibeta tawala ni bhene kwa miaka elfu.
7 Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nʼụlọ mkpọrọ ya pụta.
Bho miaka elfu jhifikili kumwishu, shetani ibeta kubhopolibhwa kuhoma mu ligereza lya muene.
8 Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba niile nọ nʼakụkụ anọ nke ụwa, ya bụ Gog na Magog, ọ ga-akpọkọta ha maka agha. Ọnụọgụgụ ha dịka aja dị nʼikpere osimiri.
Ibetakulota kwibhala kubhakofya bhamataifa mu kona sincheche sya dunia- Gogu ni Magogu - kubhaleta pamonga kwa ndabha jha vita. Bhibeta kujha bhamehele kama n'sanga ghwa bahari.
9 Ha biliri agha guzo nʼụwa niile, gbaa ụlọ ikwu nke ndị nsọ Chineke hụrụ nʼanya gburugburu. Ma ọkụ sitere nʼeluigwe gbadata repịa ha.
Napeliki sauti mbaha kuhoma kiti kya enzi jhijobha, “Langayi! Makao gha K'yara ghajhele pamonga ni gha bhanadamu, ni muene ibeta kutama pamonga nabhu. Bhibeta kujha bhanu bha muene, ni K'yara muene ibetakujha nabhu na ibetakujha K'yara ghwa bhene.
10 Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165, Limnē Pyr g3041 g4442)
Ibetakupolosya khila lihosi kuhoma mu mihu gha bhene, na Pibetalepi kujhe ni kifo kabhele, au kuombolesya, au kulela, au maumivu. Mambo gha muandi ghamalikup'eta. (aiōn g165, Limnē Pyr g3041 g4442)
11 Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, na onye nọkwasịrị nʼelu ya. Ụwa na mbara eluigwe si nʼihu ya gbapụ, ahụkwaghị ebe ọbụla nye ha.
Kabhele nabhwene kiti kya enzi kibhaha kibhalafu ni jhola jhaatamili panani pa muene. Dunia ni mbingu syajumbili patali kuhoma uwepo bhwa muene, lakini pajhele ni nafasi jha bhene kulota.
12 Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.
Nabhabhuene bhabhafuili - hodari ni bhabhabelikujha bha muhimu bhajhemili pa kiti kya enzi, ni fitabu fya funulibhu. Kabhele kitabu k'enge kyafungulibhu kitabu kya uzima. Bhafu bhahukumibhu kwa khela kyakyalembibhu mugati mu kitabu matokeo gha khela kyabhabhombili.
13 Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. (Hadēs g86)
Bahari jhabhapisili bhafu ambabho bhajhele mugati mwake. Ni bhafu bhahukumibhu kulengana ni kyabhakhetili. (Hadēs g86)
14 Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. (Hadēs g86, Limnē Pyr g3041 g4442)
Kifo ni kuzimu fyataghibhu mugati mu nyanja jha muoto. Ejhe ndo mauti jha pili - nyanja jha muoto. (Hadēs g86, Limnē Pyr g3041 g4442)
15 Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Kama lihina lya jhejhioha lyapatikene lepi lilembibhu mugati mu kitabu kya uzima, ataghibhu mugati mu nyanja jha muoto. (Limnē Pyr g3041 g4442)

< Mkpughe 20 >