< Abụ Ọma 92 >

1 Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu, 2 ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị, 3 jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ. 4 Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ. 5 Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche. 6 Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta, 7 ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 8 Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi. 9 Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị. 10 I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; awụsala m mmanụ dị mma. 11 Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri. 12 Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn, 13 nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị. 14 Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ, 15 na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”

< Abụ Ọma 92 >