< Abụ Ọma 88 >

1 Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra. O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m, nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị. 2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị. Chee ntị gị nụrụ akwa m. 3 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. (Sheol h7585) 4 Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike. 5 A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị. 6 Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya. 7 Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. (Sela) 8 Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi; 9 anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị, 10 ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? (Sela) 11 Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi? 12 A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ? 13 Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ. 14 O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị? 15 Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba. 16 Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi. 17 Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile. 18 Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.

< Abụ Ọma 88 >