< Abụ Ọma 59 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya. O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m. 2 Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ. 3 Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m. 4 Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m! 5 Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gị onye bụ Chineke nke Izrel, kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. (Sela) 6 Nʼanyasị, ha na-alaghachi, na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 7 Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?” 8 Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; ị na-akwa mba ndị a niile emo. 9 O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. 10 Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. Chineke ga-ebutere m ụzọ mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị. 11 O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. Were ike gị mee ka ha wagharịa, wedakwaa ha nʼala. 12 Ka e jide ha nʼime nganga ha, nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, na nʼihi okwu ọnụ ha. Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha, 13 jiri iwe ọkụ repịa ha, repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, na Chineke na-achị Jekọb. 14 Nʼanyasị ha na-alaghachi; na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 15 Ha na-awagharị na-achọ nri, na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha. 16 Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. 17 O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-adabere.

< Abụ Ọma 59 >