< Abụ Ọma 55 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. O Chineke, nụrụ ekpere m, agbakwala arịrịọ m nkịtị; 2 ṅaa m ntị, zaakwa m. Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude 3 nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha. 4 Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m. 5 Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; oke egwu ekpuchiela m. 6 Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike. 7 Agaara m efelaga ebe dị anya, ga nọrọ nʼọzara; (Sela) 8 Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m, ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.” 9 O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo. 10 Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; iro na mmegbu dị nʼime ya. 11 A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo. 12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, apụrụ m ịnagide ya; a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ. 13 Maọbụ gị, nwoke dịka m, onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma, 14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, nʼụlọ Chineke, ka anyị na-ejegharị nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe. 15 Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha. (Sheol h7585) 16 Ma akpọkuru m Chineke, Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m. 17 Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya ma ọ na-anụkwa olu m. 18 Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, site nʼagha niile e busoro m, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m. 19 Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, onye na-adịghị agbanwe, ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. (Sela) 20 Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya, ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ. 21 Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ ka bọta, ma ibu agha juru ya obi; okwu ya niile dị nro karịa mmanụ, ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha. 22 Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, ọ ga-agba gị ume; ọ gaghị ekwe ka ewezuga onye ezi omume. 23 Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure; ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha. Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

< Abụ Ọma 55 >