< Abụ Ọma 53 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. 2 Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke. 3 Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị otu onye. 4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Chineke. 5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị. Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị; i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha. 6 O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!

< Abụ Ọma 53 >