< Abụ Ọma 52 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.” Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike? Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi, gị onye Chineke na-eleda anya?
For the Chief Musician. A contemplation by David, when Doeg the Edomite came and told Saul, “David has come to Ahimelech’s house.” Why do you boast of mischief, mighty man? God’s loving kindness endures continually.
2 Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi; ọ dị ka agụba dị nkọ, gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.
Your tongue plots destruction, like a sharp razor, working deceitfully.
3 Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. (Sela)
You love evil more than good, lying rather than speaking the truth. (Selah)
4 O onye ire aghụghọ! Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.
You love all devouring words, you deceitful tongue.
5 Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị, ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. (Sela)
God will likewise destroy you forever. He will take you up, and pluck you out of your tent, and root you out of the land of the living. (Selah)
6 Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu; ha ga-achị ya ọchị na-asị,
The righteous also will see it, and fear, and laugh at him, saying,
7 “Ugbu a, lee nwoke ahụ, onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya. Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu. O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”
“Behold, this is the man who didn’t make God his strength, but trusted in the abundance of his riches, and strengthened himself in his wickedness.”
8 Ma adị m ka osisi oliv, nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke, nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
But as for me, I am like a green olive tree in God’s house. I trust in God’s loving kindness forever and ever.
9 Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere; aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ. Olileanya m ga-adị nʼime aha gị, nʼihi na aha gị dị mma.
I will give you thanks forever, because you have done it. I will hope in your name, for it is good, in the presence of your saints.

< Abụ Ọma 52 >