< Abụ Ọma 40 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Eji m ndidi chere Onyenwe anyị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
For the Chief Musician. A Psalm by David. I waited patiently for the LORD. He turned to me, and heard my cry.
2 O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
He brought me up also out of a horrible pit, out of the miry clay. He set my feet on a rock, and gave me a firm place to stand.
3 O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.
He has put a new song in my mouth, even praise to our God. Many shall see it, and fear, and shall trust in the LORD.
4 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
Blessed is the man who makes the LORD his trust, and doesn’t respect the proud, nor such as turn away to lies.
5 O Onyenwe anyị Chineke m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.
Many, LORD, my God, are the wonderful works which you have done, and your thoughts which are towards us. They can’t be declared back to you. If I would declare and speak of them, they are more than can be counted.
6 Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
Sacrifice and offering you didn’t desire. You have opened my ears. You have not required burnt offering and sin offering.
7 Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.
Then I said, “Behold, I have come. It is written about me in the book in the scroll.
8 O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.”
I delight to do your will, my God. Yes, your law is within my heart.”
9 Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m.
I have proclaimed glad news of righteousness in the great assembly. Behold, I will not seal my lips, LORD, you know.
10 Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
I have not hidden your righteousness within my heart. I have declared your faithfulness and your salvation. I have not concealed your loving kindness and your truth from the great assembly.
11 O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
Don’t withhold your tender mercies from me, LORD. Let your loving kindness and your truth continually preserve me.
12 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m.
For innumerable evils have surrounded me. My iniquities have overtaken me, so that I am not able to look up. They are more than the hairs of my head. My heart has failed me.
13 O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m; O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
Be pleased, LORD, to deliver me. Hurry to help me, LORD.
14 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere.
Let them be disappointed and confounded together who seek after my soul to destroy it. Let them be turned backward and brought to dishonour who delight in my hurt.
15 Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha.
Let them be desolate by reason of their shame that tell me, “Aha! Aha!”
16 Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
Let all those who seek you rejoice and be glad in you. Let such as love your salvation say continually, “Let the LORD be exalted!”
17 Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; ka Onyenwe anyị cheta m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.
But I am poor and needy. May the Lord think about me. You are my help and my deliverer. Don’t delay, my God.

< Abụ Ọma 40 >