< Abụ Ọma 146 >

1 Toonu Onyenwe anyị. O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. 2 Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ. 3 Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. 4 Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. 5 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya. 6 Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7 Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, 8 Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. 9 Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. 10 Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.

< Abụ Ọma 146 >