< Abụ Ọma 140 >

1 Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche.
For the Chief Musician. A Psalm by David. Deliver me, LORD, from evil men. Preserve me from violent men:
2 Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile.
those who devise mischief in their hearts. They continually gather themselves together for war.
3 Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. (Sela)
They have sharpened their tongues like a serpent. Viper’s poison is under their lips. (Selah)
4 Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m.
LORD, keep me from the hands of the wicked. Preserve me from the violent men who have determined to trip my feet.
5 Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. (Sela)
The proud have hidden a snare for me, they have spread the cords of a net by the path. They have set traps for me. (Selah)
6 A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.” Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara.
I said to the LORD, “You are my God.” Listen to the cry of my petitions, LORD.
7 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha.
LORD, the Lord, the strength of my salvation, you have covered my head in the day of battle.
8 Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. (Sela)
LORD, don’t grant the desires of the wicked. Don’t let their evil plans succeed, or they will become proud. (Selah)
9 Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.
As for the head of those who surround me, let the mischief of their own lips cover them.
10 Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.
Let burning coals fall on them. Let them be thrown into the fire, into miry pits, from where they never rise.
11 Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.
An evil speaker won’t be established in the earth. Evil will hunt the violent man to overthrow him.
12 Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.
I know that the LORD will maintain the cause of the afflicted, and justice for the needy.
13 Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
Surely the righteous will give thanks to your name. The upright will dwell in your presence.

< Abụ Ọma 140 >