< Abụ Ọma 136 >

1 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. 2 Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. 3 Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. 4 Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche, 5 Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile, 6 Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri, 7 Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa, 8 Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie, 9 Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị, 10 Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, 11 O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, 12 O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; 13 Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, 14 Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, 15 Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; 16 Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, 17 Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, 18 O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, 19 O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait, 20 Na Ọg eze Bashan, 21 Were ala ha nye dịka ihe nketa, 22 O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, 23 Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, 24 Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, 25 Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri, 26 Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.

< Abụ Ọma 136 >