< Abụ Ọma 133 >

1 Abụ nrigo, nke Devid. Lee ka o si bụrụ ihe dị mma na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu! 2 Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, ruokwa nʼolu uwe mwụda ya. 3 Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

< Abụ Ọma 133 >