< Abụ Ọma 132 >

1 Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, cheta Devid, nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ. 2 Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị, kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb: 3 “Agaghị m abanye nʼime ụlọ m maọbụ rigoo nʼihe ndina m, 4 agaghị m arahụ ụra, egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra, 5 tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.” 6 Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata, anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim. 7 “Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya. 8 ‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị. 9 Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’” 10 Nʼihi ohu gị, bụ Devid, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ. 11 Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: “Otu nʼime ụmụ gị, ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, 12 ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ niile m kuziri ha, mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.” 13 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya; 14 “Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ. 15 Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya. 16 Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ. 17 “Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ. 18 Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”

< Abụ Ọma 132 >