< Abụ Ọma 132 >

1 Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, cheta Devid, nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.
A Song of Ascents. LORD, remember David and all his affliction,
2 Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị, kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:
how he swore to the LORD, and vowed to the Mighty One of Jacob:
3 “Agaghị m abanye nʼime ụlọ m maọbụ rigoo nʼihe ndina m,
“Surely I will not come into the structure of my house, nor go up into my bed;
4 agaghị m arahụ ụra, egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,
I will not give sleep to my eyes, or slumber to my eyelids,
5 tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”
until I find out a place for the LORD, a dwelling for the Mighty One of Jacob.”
6 Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata, anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.
Behold, we heard of it in Ephrathah. We found it in the field of Jaar.
7 “Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
“We will go into his dwelling place. We will worship at his footstool.”
8 ‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.
Arise, LORD, into your resting place, you, and the ark of your strength.
9 Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’”
Let your priests be clothed with righteousness. Let your saints shout for joy!
10 Nʼihi ohu gị, bụ Devid, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.
For your servant David’s sake, don’t turn away the face of your anointed one.
11 Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: “Otu nʼime ụmụ gị, ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,
The LORD has sworn to David in truth. He will not turn from it: “I will set the fruit of your body on your throne.
12 ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ niile m kuziri ha, mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”
If your children will keep my covenant, my testimony that I will teach them, their children also will sit on your throne forever more.”
13 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;
For the LORD has chosen Zion. He has desired it for his habitation.
14 “Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
“This is my resting place forever. I will live here, for I have desired it.
15 Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.
I will abundantly bless her provision. I will satisfy her poor with bread.
16 Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.
I will also clothe her priests with salvation. Her saints will shout aloud for joy.
17 “Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.
I will make the horn of David to bud there. I have ordained a lamp for my anointed.
18 Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”
I will clothe his enemies with shame, but on himself, his crown will shine.”

< Abụ Ọma 132 >