< Abụ Ọma 130 >

1 Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 2 Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara. 3 O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4 Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 5 Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6 Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 7 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 8 Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.

< Abụ Ọma 130 >