< Abụ Ọma 126 >

1 Abụ nrigo. Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ.
A Song of Ascents. When the LORD brought back those who returned to Zion, we were like those who dream.
2 Ọchị juru anyị ọnụ, abụ ọṅụ jukwara anyị ire. Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, “Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.”
Then our mouth was filled with laughter, and our tongue with singing. Then they said amongst the nations, “The LORD has done great things for them.”
3 Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ.
The LORD has done great things for us, and we are glad.
4 Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev.
Restore our fortunes again, LORD, like the streams in the Negev.
5 Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ.
Those who sow in tears will reap in joy.
6 Onye ji ịkwa akwa buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, mgbe ha bu ukwu ọka ha.
He who goes out weeping, carrying seed for sowing, will certainly come again with joy, carrying his sheaves.

< Abụ Ọma 126 >