< Abụ Ọma 105 >

1 Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya. Meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
Give thanks to the LORD! Call on his name! Make his doings known amongst the peoples.
2 Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto; kwupụtanụ ọrụ ihe ịrịbama ya niile.
Sing to him, sing praises to him! Tell of all his marvellous works.
3 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa.
Glory in his holy name. Let the heart of those who seek the LORD rejoice.
4 Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Seek the LORD and his strength. Seek his face forever more.
5 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta,
Remember his marvellous works that he has done: his wonders, and the judgements of his mouth,
6 unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
you offspring of Abraham, his servant, you children of Jacob, his chosen ones.
7 Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
He is the LORD, our God. His judgements are in all the earth.
8 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ,
He has remembered his covenant forever, the word which he commanded to a thousand generations,
9 ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
the covenant which he made with Abraham, his oath to Isaac,
10 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
and confirmed it to Jacob for a statute; to Israel for an everlasting covenant,
11 “Aga m enye gị ala Kenan dịka oke i ga-eketa.”
saying, “To you I will give the land of Canaan, the lot of your inheritance,”
12 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya.
when they were but a few men in number, yes, very few, and foreigners in it.
13 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ.
They went about from nation to nation, from one kingdom to another people.
14 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
He allowed no one to do them wrong. Yes, he reproved kings for their sakes,
15 sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka; unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
“Don’t touch my anointed ones! Do my prophets no harm!”
16 O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
He called for a famine on the land. He destroyed the food supplies.
17 o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu.
He sent a man before them. Joseph was sold for a slave.
18 Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu,
They bruised his feet with shackles. His neck was locked in irons,
19 tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
until the time that his word happened, and the LORD’s word proved him true.
20 Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
The king sent and freed him, even the ruler of peoples, and let him go free.
21 O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
He made him lord of his house, and ruler of all of his possessions,
22 ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe.
to discipline his princes at his pleasure, and to teach his elders wisdom.
23 Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
Israel also came into Egypt. Jacob lived in the land of Ham.
24 Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
He increased his people greatly, and made them stronger than their adversaries.
25 ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
He turned their heart to hate his people, to conspire against his servants.
26 O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.
He sent Moses, his servant, and Aaron, whom he had chosen.
27 Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
They performed miracles amongst them, and wonders in the land of Ham.
28 O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
He sent darkness, and made it dark. They didn’t rebel against his words.
29 O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara, nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
He turned their waters into blood, and killed their fish.
30 Ala ha niile jupụtara nʼawọ ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.
Their land swarmed with frogs, even in the rooms of their kings.
31 O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta dị iche iche ejupụta nʼala ha niile.
He spoke, and swarms of flies came, and lice in all their borders.
32 Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe nʼala ha niile;
He gave them hail for rain, with lightning in their land.
33 o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha, kwatusịakwa osisi niile dị nʼala ha.
He struck their vines and also their fig trees, and shattered the trees of their country.
34 O kwuru okwu, igurube na ụkpana a na-apụghị ịgụta ọnụ jupụtara ebe niile;
He spoke, and the locusts came with the grasshoppers, without number.
35 ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ, ripịakwa mkpụrụ niile ha kụrụ nʼubi ha.
They ate up every plant in their land, and ate up the fruit of their ground.
36 Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
He struck also all the firstborn in their land, the first fruits of all their manhood.
37 Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
He brought them out with silver and gold. There was not one feeble person amongst his tribes.
38 Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ, nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.
Egypt was glad when they departed, for the fear of them had fallen on them.
39 Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi, na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
He spread a cloud for a covering, fire to give light in the night.
40 Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel, jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.
They asked, and he brought quails, and satisfied them with the bread of the sky.
41 O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara; ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.
He opened the rock, and waters gushed out. They ran as a river in the dry places.
42 Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham.
For he remembered his holy word, and Abraham, his servant.
43 O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;
He brought his people out with joy, his chosen with singing.
44 o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche, ha ghọrọ ndị nnweta nke ihe ndị ọzọ rụpụta,
He gave them the lands of the nations. They took the labour of the peoples in possession,
45 ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile ma na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. Toonu Onyenwe anyị.
that they might keep his statutes, and observe his laws. Praise the LORD!

< Abụ Ọma 105 >