< Ilu 25 >

1 Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.
These also are proverbs of Solomon, which the men of Hezekiah king of Judah copied out.
2 Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.
It is the glory of God to conceal a thing, but the glory of kings is to search out a matter.
3 Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.
As the heavens for height, and the earth for depth, so the hearts of kings are unsearchable.
4 Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;
Take away the dross from the silver, and material comes out for the refiner.
5 wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.
Take away the wicked from the king’s presence, and his throne will be established in righteousness.
6 Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,
Don’t exalt yourself in the presence of the king, or claim a place amongst great men;
7 ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ
for it is better that it be said to you, “Come up here,” than that you should be put lower in the presence of the prince, whom your eyes have seen.
8 e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?
Don’t be hasty in bringing charges to court. What will you do in the end when your neighbour shames you?
9 Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu, emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,
Debate your case with your neighbour, and don’t betray the confidence of another,
10 ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere, agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.
lest one who hears it put you to shame, and your bad reputation never depart.
11 Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.
A word fitly spoken is like apples of gold in settings of silver.
12 Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.
As an earring of gold, and an ornament of fine gold, so is a wise reprover to an obedient ear.
13 Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
As the cold of snow in the time of harvest, so is a faithful messenger to those who send him; for he refreshes the soul of his masters.
14 Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
As clouds and wind without rain, so is he who boasts of gifts deceptively.
15 Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
By patience a ruler is persuaded. A soft tongue breaks the bone.
16 Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
Have you found honey? Eat as much as is sufficient for you, lest you eat too much, and vomit it.
17 Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.
Let your foot be seldom in your neighbour’s house, lest he be weary of you, and hate you.
18 Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha, dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.
A man who gives false testimony against his neighbour is like a club, a sword, or a sharp arrow.
19 Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe, maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.
Confidence in someone unfaithful in time of trouble is like a bad tooth or a lame foot.
20 Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.
As one who takes away a garment in cold weather, or vinegar on soda, so is one who sings songs to a heavy heart.
21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.
If your enemy is hungry, give him food to eat. If he is thirsty, give him water to drink;
22 Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
for you will heap coals of fire on his head, and the LORD will reward you.
23 Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
The north wind produces rain; so a backbiting tongue brings an angry face.
24 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
It is better to dwell in the corner of the housetop than to share a house with a contentious woman.
25 Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
Like cold water to a thirsty soul, so is good news from a far country.
26 Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.
Like a muddied spring and a polluted well, so is a righteous man who gives way before the wicked.
27 Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ, otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.
It is not good to eat much honey, nor is it honourable to seek one’s own honour.
28 Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.
Like a city that is broken down and without walls is a man whose spirit is without restraint.

< Ilu 25 >