< Ilu 14 >

1 Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.
The wisdom of women buildeth their house; but folly plucketh it down with her hands.
2 Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị.
He that walketh in his uprightness feareth Jehovah; but he that is perverted in his ways despiseth him.
3 Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha.
In the fool's mouth is a rod of pride; but the lips of the wise shall preserve them.
4 Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ.
Where no oxen are, the crib is clean; but much increase is by the strength of the ox.
5 Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla.
A faithful witness will not lie; but a false witness uttereth lies.
6 Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.
A scorner seeketh wisdom, and there is none [for him]; but knowledge is easy unto the intelligent.
7 Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya.
Go from the presence of a foolish man, in whom thou perceivest not the lips of knowledge.
8 Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.
The wisdom of the prudent is to discern his way; but the folly of the foolish is deceit.
9 Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi.
Fools make a mock at trespass; but for the upright there is favour.
10 Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya.
The heart knoweth its own bitterness, and a stranger doth not intermeddle with its joy.
11 A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu.
The house of the wicked shall be overthrown; but the tent of the upright shall flourish.
12 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
There is a way that seemeth right unto a man, but the end thereof is the ways of death.
13 Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ.
Even in laughter the heart is sorrowful, and the end of mirth is sadness.
14 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya.
The backslider in heart shall be filled with his own ways, and the good man from what is in himself.
15 Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.
The simple believeth every word; but the prudent [man] heedeth his going.
16 Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
A wise [man] feareth and departeth from evil; but the foolish is overbearing and confident.
17 Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị.
He that is soon angry dealeth foolishly, and a man of mischievous devices is hated.
18 Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma.
The simple inherit folly; but the prudent are crowned with knowledge.
19 Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume.
The evil bow before the good, and the wicked at the gates of the righteous [man].
20 Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.
He that is poor is hated even of his own neighbour; but the rich hath many friends.
21 Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma.
He that despiseth his neighbour sinneth; but he that is gracious to the afflicted, happy is he.
22 Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Do they not err that devise evil? but loving-kindness and truth are for those that devise good.
23 Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa.
In all labour there is profit; but the talk of the lips [tendeth] only to want.
24 Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru.
The crown of the wise is their riches; the folly of the foolish is folly.
25 Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ.
A true witness delivereth souls; but deceit uttereth lies.
26 Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ.
In the fear of Jehovah is strong confidence, and his children shall have a place of refuge.
27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
The fear of Jehovah is a fountain of life, to turn away from the snares of death.
28 Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla.
In the multitude of people is the king's glory; but in the lack of people is the ruin of a prince.
29 Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
He that is slow to anger is of great understanding; but he that is hasty of spirit exalteth folly.
30 Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure.
A sound heart is the life of the flesh; but envy the rottenness of the bones.
31 Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke.
He that oppresseth the poor reproacheth his Maker; but he that honoureth Him is gracious to the needy.
32 Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara.
The wicked is driven away by his evil-doing; but the righteous trusteth, [even] in his death.
33 Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya.
Wisdom resteth in the heart of the intelligent [man]; but that which is in the foolish maketh itself known.
34 Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla.
Righteousness exalteth a nation; but sin is a reproach to peoples.
35 Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.
The king's favour is toward a wise servant; but his wrath is [against] him that causeth shame.

< Ilu 14 >