< Ọnụọgụgụ 16 >

1 Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi
Now Korah, the son of Izhar, the son of Kohath, the son of Levi, with Dathan and Abiram, the sons of Eliab, and On, the son of Peleth, sons of Reuben, took some men.
2 bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel.
They rose up before Moses, with some of the children of Israel, two hundred and fifty princes of the congregation, called to the assembly, men of renown.
3 Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”
They assembled themselves together against Moses and against Aaron, and said to them, “You take too much on yourself, since all the congregation are holy, everyone of them, and the LORD is amongst them! Why do you lift yourselves up above the LORD’s assembly?”
4 Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.
When Moses heard it, he fell on his face.
5 Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
He said to Korah and to all his company, “In the morning, the LORD will show who are his, and who is holy, and will cause him to come near to him. Even him whom he shall choose, he will cause to come near to him.
6 Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
Do this: have Korah and all his company take censers,
7 mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”
put fire in them, and put incense on them before the LORD tomorrow. It shall be that the man whom the LORD chooses, he shall be holy. You have gone too far, you sons of Levi!”
8 Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị!
Moses said to Korah, “Hear now, you sons of Levi!
9 Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi?
Is it a small thing to you that the God of Israel has separated you from the congregation of Israel, to bring you near to himself, to do the service of the LORD’s tabernacle, and to stand before the congregation to minister to them;
10 Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja?
and that he has brought you near, and all your brothers the sons of Levi with you? Do you seek the priesthood also?
11 Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?”
Therefore you and all your company have gathered together against the LORD! What is Aaron that you complain against him?”
12 Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.
Moses sent to call Dathan and Abiram, the sons of Eliab; and they said, “We won’t come up!
13 Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
Is it a small thing that you have brought us up out of a land flowing with milk and honey, to kill us in the wilderness, but you must also make yourself a prince over us?
14 Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
Moreover you haven’t brought us into a land flowing with milk and honey, nor given us inheritance of fields and vineyards. Will you put out the eyes of these men? We won’t come up.”
15 Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”
Moses was very angry, and said to the LORD, “Don’t respect their offering. I have not taken one donkey from them, neither have I hurt one of them.”
16 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
Moses said to Korah, “You and all your company go before the LORD, you, and they, and Aaron, tomorrow.
17 Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
Each man take his censer and put incense on it, and each man bring before the LORD his censer, two hundred and fifty censers; you also, and Aaron, each with his censer.”
18 Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
They each took his censer, and put fire in it, and laid incense on it, and stood at the door of the Tent of Meeting with Moses and Aaron.
19 Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
Korah assembled all the congregation opposite them to the door of the Tent of Meeting. The LORD’s glory appeared to all the congregation.
20 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
The LORD spoke to Moses and to Aaron, saying,
21 “Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”
“Separate yourselves from amongst this congregation, that I may consume them in a moment!”
22 Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?”
They fell on their faces, and said, “God, the God of the spirits of all flesh, shall one man sin, and will you be angry with all the congregation?”
23 Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya,
The LORD spoke to Moses, saying,
24 “Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’”
“Speak to the congregation, saying, ‘Get away from around the tent of Korah, Dathan, and Abiram!’”
25 Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.
Moses rose up and went to Dathan and Abiram; and the elders of Israel followed him.
26 Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”
He spoke to the congregation, saying, “Depart, please, from the tents of these wicked men, and touch nothing of theirs, lest you be consumed in all their sins!”
27 Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.
So they went away from the tent of Korah, Dathan, and Abiram, on every side. Dathan and Abiram came out, and stood at the door of their tents with their wives, their sons, and their little ones.
28 Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.
Moses said, “Hereby you shall know that the LORD has sent me to do all these works; for they are not from my own mind.
29 Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.
If these men die the common death of all men, or if they experience what all men experience, then the LORD hasn’t sent me.
30 Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.” (Sheol h7585)
But if the LORD makes a new thing, and the ground opens its mouth, and swallows them up with all that belong to them, and they go down alive into Sheol, then you shall understand that these men have despised the LORD.” (Sheol h7585)
31 Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ,
As he finished speaking all these words, the ground that was under them split apart.
32 ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
The earth opened its mouth and swallowed them up with their households, all of Korah’s men, and all their goods.
33 Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. (Sheol h7585)
So they, and all that belonged to them went down alive into Sheol. The earth closed on them, and they perished from amongst the assembly. (Sheol h7585)
34 Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”
All Israel that were around them fled at their cry; for they said, “Lest the earth swallow us up!”
35 Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
Fire came out from the LORD, and devoured the two hundred and fifty men who offered the incense.
36 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
The LORD spoke to Moses, saying,
37 “Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.
“Speak to Eleazar the son of Aaron the priest, that he take up the censers out of the burning, and scatter the fire away from the camp; for they are holy,
38 Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”
even the censers of those who sinned against their own lives. Let them be beaten into plates for a covering of the altar, for they offered them before the LORD. Therefore they are holy. They shall be a sign to the children of Israel.”
39 Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,
Eleazar the priest took the bronze censers which those who were burnt had offered; and they beat them out for a covering of the altar,
40 dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.
to be a memorial to the children of Israel, to the end that no stranger who isn’t of the offspring of Aaron, would come near to burn incense before the LORD, that he not be as Korah and as his company; as the LORD spoke to him by Moses.
41 Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”
But on the next day all the congregation of the children of Israel complained against Moses and against Aaron, saying, “You have killed the LORD’s people!”
42 Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.
When the congregation was assembled against Moses and against Aaron, they looked towards the Tent of Meeting. Behold, the cloud covered it, and the LORD’s glory appeared.
43 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ.
Moses and Aaron came to the front of the Tent of Meeting.
44 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
The LORD spoke to Moses, saying,
45 “Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.
“Get away from amongst this congregation, that I may consume them in a moment!” They fell on their faces.
46 Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”
Moses said to Aaron, “Take your censer, put fire from the altar in it, lay incense on it, carry it quickly to the congregation, and make atonement for them; for wrath has gone out from the LORD! The plague has begun.”
47 Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.
Aaron did as Moses said, and ran into the middle of the assembly. The plague had already begun amongst the people. He put on the incense, and made atonement for the people.
48 O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.
He stood between the dead and the living; and the plague was stayed.
49 Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa. A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga.
Now those who died by the plague were fourteen thousand and seven hundred, in addition to those who died about the matter of Korah.
50 Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.
Aaron returned to Moses to the door of the Tent of Meeting, and the plague was stopped.

< Ọnụọgụgụ 16 >