< Nehum 2 >

1 Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. Chee ụzọ niile nche, mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. Chịkọtakwa ike gị niile. 2 Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi. 3 Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee. 4 Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma. 5 Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, dozie ọta nche ha niile nʼusoro. 6 Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji. 7 E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi. 8 Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ. 9 Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ. 10 E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala. 11 Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla? 12 Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu. 13 “Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ, mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi. Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa. A gaghị anụkwa olu ndị ozi gị ọzọ.”

< Nehum 2 >