< Matiu 3 >

1 Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ,
Mu magono ghala Yohana Mbatizaji ahidili akihubiri mu nyika j'ha Yuda akajha ijobha,
2 “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”
“Mtubuayi kwa maana bhufalme bhwa mbinguni bhwikaribila.”
3 Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’”
Kwa ndabha oj'ho ndo j'haananibhu nu nabii Isaya ajobhili, “sauti j'ha munu j'haikutibhwa kuhoma jangwani; 'mubhekai tayari nj'hela j'ha Bwana, mughanyosiaghe mapito ghake.”
4 Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
Henu Yohana afuele maj'hoj'ha gha ngamia ni nkanda ghwa ngosi mu nsana ghwake kyakulya kiake kyaj'hele nzige ni bhuoki bhwa munsitu.
5 Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya.
Kisha Yerusalemu, Yuda j'hioha, ni lieneo lyoha lyalisyonguiki kiholo Yorodani bhalotili kwa muene.
6 Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
Bhaj'hele bhibatisibhwa nu muene mu kuh'olo Yorodani khoni bhitubu dhambi syabho.
7 Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?
Lakini bhoabhabhuene bhingi bha mafarisayo ni masadukayo bhihida kwa muene kubatisibhwa, abhajobhili, “Muenga bhuzao bhwa liyoka bhwabhuj'ha ni sumu niani j'ha abhaonyili kuj'hijumba ghadhabu j'haj'hihida?
8 Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu.
Muhogolai matunda ghaipasyayo toba.
9 Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
Na msifiriri ni kujobhesana miongoni mwinu, 'Tuj'henaku Ibrahimu kama tata j'hitu.' Kwa kujha nikabhajobhela K'yara ibhwesya kun'jhinula Ibrahimu bhana hata kuhoma mu maganga agha.
10 Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ.
Tayari libhangu limalili kubhekibhwa mu mzizi bhwa libehe. Kwa ejhu kila libehe lyalibelili kuhogola matunda manofu lidumulibhwa ni kutaghibhwa mu muoto.
11 “Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim.
Nikabhabatisya kwa masi kwa nj'ela j'ha toba. Lakini muene ibetakubhabatisya kwa Roho Mtakatifu ni kwa muoto.
12 Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”
Ni pepeto lyake lijhele mmabhoko mwa muene kusuka kabisa bhuwanda bhuake ni kuj'hibhongana ngano j'hiake mu lighala. Lakini ibetakughanyanya makapi kwa muoto ambabho bhwibhwesya lepi kusimika.
13 Mgbe ahụ, Jisọs sitere na Galili bịa nʼosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim.
Kisha Yesu akahida kuhoma Galilaya mpaka kih'olo Yorodani kubatisibhwa ni Yohana.
14 Ma Jọn chọrọ igbochi ya, sị, “Ọ bụ m kwesiri ịbịakwute gị ka ị mee m baptizim. Gịnị mere i ji abịakwute m?”
Lakini Yohana alondeghe kum'besya akajobha, “Nene nilonda kubatisibhwa naghwe, bhebhe ghwihida kwa nene?”
15 Ma Jisọs zara ya sị, “Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile.” Mgbe ahụ Jọn kwenyere.
Yesu an'jibili akajobha, “Ruhusuayi ej'helai naha henu, kwa kuj'ha ndo kya j'hikatulondeka kutimisya haki j'hioha.” Kisha Yohana akanduhusu.
16 Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi.
Baada j'ha kuj'ha abatisibhu, mara Yesu abhokili mmasi, ni langai, Mbingu syafunguiuki kwa muene. Na ambuene Roho ghwa K'yara kyaiselela kwa mfano ghwa nj'hebha ni kut'ola panani pa muene.
17 Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”
Langai, sauti j'hah'omili kumbinguni j'hikawa j'hijobha, “Oj'ho ndo mwanabhangu. J'hanipendesibhu sana naku.”

< Matiu 3 >