< Luk 4 >

1 Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara.
Jesus, full of the Holy Spirit, returned from the Jordan River and was led by the Spirit into the desert,
2 Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.
where he was tempted by the devil for forty days. He didn't eat anything during that whole time, so at the end he was starving.
3 Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.”
The devil said to him, “If you are the Son of God, command this stone to become bread.”
4 Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’”
“It is written in Scripture, ‘You shall not live on bread alone,’” Jesus answered.
5 Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya.
The devil led him up to a high place, and in a rapid view showed him all the kingdoms of the world.
6 Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha.
Then the devil said to Jesus, “I will give you authority over all of them, and their glory. This authority has been given to me, and I can give it to anyone I want.
7 Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.”
Bow down and worship me and you can have it all.”
8 Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’”
“It is written in Scripture, ‘You shall worship the Lord your God, and you shall serve only him,’” Jesus replied.
9 Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala.
The devil took Jesus to Jerusalem, set him on the top of the Temple, and told him, “If you are the Son of God, then jump!
10 Nʼihi na e dere ya, “‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma;
For it is written in Scripture, ‘He will order his angels to care for you,
11 ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
holding you up to protect you from stumbling over a stone.’”
12 Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa.”
“It is written in Scripture, ‘You shall not tempt the Lord your God,’” Jesus replied.
13 Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara.
When the devil had completed all his temptations, he waited for another opportunity.
14 Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile.
Jesus returned to Galilee, full of the Spirit's power. News about him spread everywhere.
15 O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya.
Jesus taught in their synagogues, and everyone praised him.
16 Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ.
When he arrived in Nazareth, where he had grown up, he went to the synagogue on the Sabbath day as usual.
17 E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị,
The scroll of the prophet Isaiah was handed to him. Jesus unrolled the scroll and found the place where it's written:
18 “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
“The Spirit of the Lord is upon me, for he has anointed me to announce good news to the destitute. He has sent me to proclaim that prisoners will be released, the blind will see, the oppressed will be freed,
19 Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.”
and to proclaim the time of the Lord's favor.”
20 O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya.
He rolled up the scroll and gave it back to the attendant. Then he sat down. Everybody in the synagogue was staring at him.
21 Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.”
“This Scripture you've just heard has been fulfilled today!” he told them.
22 Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”
Everybody expressed their approval of him, amazed at the gracious words that came from his lips. “Isn't this Joseph's son?” they wondered.
23 Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’”
Jesus replied, “I'm sure you'll repeat this proverb to me, ‘Physician, heal yourself!’ and ask, ‘Why don't you do here in your own hometown what we heard you did in Capernaum?’
24 Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya.
But I tell you the truth, no prophet is accepted in his hometown.
25 Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii.
I guarantee that there were many widows in Israel during the time of Elijah when there was a drought for three and a half years, causing a great famine throughout the country.
26 Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn.
Yet Elijah wasn't sent to any of them. He was sent to a widow in Zarephath in the region of Sidon!
27 Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.”
Even though there were many lepers in Israel in the time of Elisha, the only one who was healed was Naaman the Syrian!”
28 Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu.
When they heard this everyone in the synagogue became furious.
29 Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ.
They jumped to their feet and threw him out of the town. Then they dragged him to the top of the hill on which the town was built in order to throw him off the cliff.
30 Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
But he walked right through them and went on his way.
31 O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe.
Jesus went down to Capernaum, a town in Galilee. On Sabbath he started teaching them.
32 Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike.
They were amazed at what he taught them for he spoke with authority.
33 Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu,
In the synagogue there was a man who was possessed by a demon. He cried out,
34 “Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!”
“So, what do you want with us, Jesus of Nazareth? Have you come to destroy us? I know who you are: God's Holy One!”
35 Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ.
Jesus interrupted him, saying. “Be quiet!” Then he ordered the demon, “Come out of him!” Throwing him to the ground right before them, the demon left the man without injuring him.
36 Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!”
They were all amazed and asked each other, “What is this teaching? With power and authority he orders evil spirits to leave—and they do!”
37 Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu.
News about Jesus spread throughout the nearby region.
38 Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka.
Leaving the synagogue, Jesus went to Simon's house. Simon's mother-in-law was sick with a high fever and those who were there asked Jesus to help.
39 O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa.
Jesus went and stood over her. He told the fever to leave her—which it did. She got up right away and prepared a meal for them.
40 Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha.
When the sun set, they brought to him all who were sick, suffering from various diseases. Jesus placed his hands on them, one after the other, and he healed them.
41 Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst.
Demons came out of many people, shouting, “You are the Son of God.” But Jesus stopped them and refused to let them speak because they knew he was the Christ.
42 Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha.
Early the following morning Jesus left to find some peace and quiet. But the crowds went out looking for him, and finally found him. They tried to stop him leaving because they did not want him to go.
43 Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.”
But he told them, “I have to go to other towns to tell them the good news of the kingdom of God too, because that is what I was sent to do.”
44 Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.
So Jesus went on traveling around, teaching the good news in the synagogues of Judea.

< Luk 4 >