< Luk 21 >

1 Ọ leliri anya elu hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nʼime igbe onyinye.
He looked up, and saw the rich people who were putting their gifts into the treasury.
2 Ọ hụkwara otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara tinye naanị mkpụrụ ego kọpa abụọ.
He saw a certain poor widow casting in two lepta.
3 Ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, nwanyị ogbenye a di ya nwụrụ etinyela ego karịa ndị ọzọ niile.
He said, "Truly I tell you, this poor widow put in more than all of them,
4 Nʼihi na ndị ọzọ niile nyere onyinye ha site nʼego mapụtaara ha nʼakụnụba ha, ma ya onwe ya sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o ji biri.”
for all these put in gifts from their abundance, but she, out of her poverty, put in all that she had to live on."
5 Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị,
As some were talking about the temple and how it was decorated with beautiful stones and gifts, he said,
6 “Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.”
"As for these things which you see, the days will come, in which there will not be left here one stone on another that will not be thrown down."
7 Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?”
They asked him, "Teacher, so when will these things be? What is the sign that these things are about to happen?"
8 Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha.
He said, "Watch out that you do not get led astray, for many will come in my name, saying, 'I am he,' and, 'The time is near.' Therefore do not follow them.
9 Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.”
When you hear of wars and disturbances, do not be terrified, for these things must happen first, but the end won't come immediately."
10 Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze.
Then he said to them, "Nation will rise against nation, and kingdom against kingdom.
11 A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe.
There will be great earthquakes, famines, and plagues in various places. There will be terrors and great signs from heaven.
12 “Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m.
But before all these things, they will lay their hands on you and will persecute you, delivering you up to synagogues and prisons, bringing you before kings and governors for my name's sake.
13 Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe.
It will turn out as a testimony for you.
14 Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza.
Settle it therefore in your hearts not to meditate beforehand how to answer,
15 Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide.
for I will give you a mouth and wisdom which all your adversaries will not be able to withstand or to contradict.
16 Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu.
You will be handed over even by parents, brothers, relatives, and friends. They will cause some of you to be put to death.
17 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.
And you will be hated by everyone because of my name.
18 Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi.
But not a hair of your head will perish.
19 Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.
"By your endurance you will win your lives.
20 “Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola.
"But when you see Jerusalem surrounded by armies, then know that its desolation is near.
21 Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya.
Then let those who are in Judea flee to the mountains. Let those who are in the midst of her depart. Let those who are in the country not enter it.
22 Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru.
For these are days of vengeance, that all things which are written may be fulfilled.
23 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ.
Woe to those who are pregnant and to those who nurse infants in those days. For there will be great distress in the land, and wrath to this people.
24 Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru.
And they will fall by the edge of the sword and be led captive into all the nations. And Jerusalem will be trampled down by non-Jewish people until the times are fulfilled. And there will be times of the non-Jewish people.
25 “A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa.
And there will be signs in the sun, and moon, and stars, and on the earth distress of nations in perplexity because of the roaring of the sea and the waves;
26 Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji.
people will be fainting from fear, and from expectation of the things which are coming on the world, for the powers of the heavens will be shaken.
27 Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii.
Then they will see the Son of Man coming in a cloud with power and great glory.
28 Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.”
But when these things begin to happen, look up, and lift up your heads, because your redemption is near."
29 Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya.
He told them a parable. "See the fig tree, and all the trees.
30 Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso.
When they are already budding, you see it and know by your own selves that the summer is already near.
31 Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso.
Even so you also, when you see these things happening, know that the Kingdom of God is near.
32 “Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
Truly I tell you, this generation will not pass away until all things are accomplished.
33 Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
Heaven and earth will pass away, but my words will by no means pass away.
34 “Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya.
"So be careful, or your hearts will be loaded down with carousing, drunkenness, and cares of this life, and that day will come on you suddenly.
35 Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa.
For it will come like a snare on all those who dwell on the surface of all the earth.
36 Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
Therefore be watchful all the time, praying that you may be able to escape all these things that will happen, and to stand before the Son of Man."
37 Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị.
Every day Jesus was teaching in the temple, and every night he would go out and spend the night on the mountain that is called Olivet.
38 Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya.
All the people came early in the morning to him in the temple to hear him.

< Luk 21 >