< Luk 11 >

1 Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.”
It happened he was praying in a certain place, and when he stopped, one of his disciples said to him, "Master, teach us how to pray, just as Johntaught his disciples."
2 Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa.
So he said to them. "When you pray, say, "Father, hallowed be thy name; May thy kingdom come,
3 Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị.
"Give us day by day our bread for the coming day;
4 Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’”
"Forgive us our sins; for we also forgive everyone who has offended us; "And bring us not into temptation."
5 Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ,
He also said to them. "Suppose you have a friend and you go to him, ‘My friend, lend me three loaves of bread,
6 nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’
"for a friend of mine is come to me from a journey, and I have nothing to set before him.’
7 Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’
"and he from indoors shall answer. ‘Do not pester me. The door is now closed, and my children are with me in bed. I cannot rise and give to you.’
8 Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.
"I tell you that, though he will not rise and give to him because he is his friend, yet because of his importunate persistence he will rise and give him whatever he needs.
9 “Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
"So I say to you. "Ask, and it shall be given to you; seek, and ye shall find; knock and it shall be opened to you.
10 Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
"For he that asks receives, and he who seeks finds, and to him who knocks the door shall be opened.
11 “Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ?
"What father is there among you who, if his son asks for a loaf, will give him a stone? Or if he asks for a fish will give him instead a serpent?
12 Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị?
"Or if he asks for an egg, will offer him a scorpion?
13 Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”
"If you give good gifts to your children, how much more shall the Father who is in heaven give the Holy spirit to those that ask him!"
14 Otu mgbe, ọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke dara ogbi, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụrụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Nke a juru igwe mmadụ ahụ anya.
Once he was casting out a dumb demon, and when the demon was gone out, the dumb man spoke, and the people wondered.
15 Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Ọ bụ site nʼike Belzebub eze ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”
But some of them said, "It is by Beelzebub, the prince of demons, that he cast out demons."
16 Ndị ọzọ, iji nwalee ya, sị ya gosi ha ihe ịrịbama nke si nʼeluigwe.
Others, tempting him, kept seeking from him a sign from heaven.
17 Ma ebe ọ bụ na ọ maara ihe ha na-eche, ọ sịrị ha, “Alaeze ọbụla kewaranụ megide ibe ya, ga-atọgbọrọ nʼefu, ezinaụlọ ọbụla nke kewakwara megide ibe ya ga-adakpọ.
He knew their intentions and said to them. "Every kingdom divided against itself is laid waste and house falls upon house.
18 Ọ bụrụ na ekwensu ekewa megide onwe ya, alaeze ya ọ ga-esi aṅaa guzosie ike? Unu na-asị na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nʼike Belzebub.
"And if Satan also is divided against himself, how shall his kingdom stand?
19 Ugbu a, ọ bụrụ na m sitere nʼike Belzebub na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ site nʼike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ya mere, ha ga-abụ ndị ikpe unu.
"Do you say that I am casting out demons by the power of Beelzebub? If I then am casting out demons by Beelzebub, by whom are your sons casting them out? They therefore shall be your judges.
20 Ma ọ bụrụ na m ji ike mkpịsịaka Chineke na-achụpụ mmụọ ọjọọ, mgbe ahụ alaeze Chineke abịarutela nʼebe unu nọ.
"But if it is by the finger of God that I am casting out demons, then the kingdom of God is come upon you.
21 “Mgbe nwoke siri ike ji ngwa agha chekwa obi ya, ihe o nwere ga-adịgidere ya nʼudo.
"When the strong man fully aroused keeps guard over his homestead, his property is undisturbed;
22 Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka ya ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ ga-anara ya ngwa agha niile bụ ihe ntụkwasị obi ya, kesakwaa ihe ọ kwatara nʼụlọ dike ahụ.
"but when the stronger man attacks him, he takes away from the strong armor in which he was trusting and divides up the spoil.
23 “Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
"He who is not for me is against me, and he who is not gathering with me is scattering.
24 “Mgbe ọbụla mmụọ na-adịghị ọcha sị nʼime mmadụ pụọ, ọ na-ejegharị nʼala kpọrọ nkụ na-achọgharị ebe izuike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị ya, mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m hapụrụ.’
"Whenever a foul spirit is gone out of a man, it roams through waterless places, in search of rest; but when it can find none, it says, ‘I will go back to the house which I have left.’
25 Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala ya dozie ya nke ọma.
When it comes and finds the house completely swept and garnished.
26 Mgbe ahụ, ọ ga-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha niile na-abata biri nʼime onye ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”
"Then it goes off and fetches seven other spirits more wicked than itself, and they go in and live there. And the last state of that man is worse than the first."
27 Mgbe ọ kpụ okwu a nʼọnụ, otu nwanyị sitere nʼime igwe mmadụ ahụ tie mkpu sị, “Ngọzị na-adịrị afọ mụrụ gị na ara nke e jiri zụọ gị.”
It happened while he was saying this, that a certain woman out of the crowd shouted to him, saying, "Blessed is the womb that bore you, and the breast that you have sucked."
28 Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”
"No, rather," he answered, "blessed are those who listen to the word of God, and keep it."
29 Dị ka igwe mmadụ ahụ na-amụba, o bidoro na-ekwu sị, “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe ịrịbama ma ọ dịghị ihe ịrịbama a ga-ezi ya karịa ihe ịrịbama Jona.
When the crowd were beginning to throng about him he proceeded to say. "This is an evil generation! It seeks a sign, and there shall be no sign be given to it except the sign of Jonah;
30 Nʼihi na dị ka Jona si bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi bụrụkwa ihe ama nye ọgbọ a.
"for as Jonah became a sign to the Ninevites, so shall the Son of man be to this generation.
31 Nʼụbọchị ahụ, eze nwanyị ndị ndịda ga-ebili soro ndị ọgbọ a guzo nʼikpe, maa ha ikpe, nʼihi na o sitere na nsọtụ nke ụwa bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn, ma lee, onye karịrị Solomọn nọ nʼebe a.
"The queen of the South shall rise up in Judgement with the men of this generation, and shall condemn them; because she came from the ends of the earth to listen to the wisdom of Solomon, and lo, one greater than Solomon is here!
32 Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe, nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona, ma lee, onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.”
"The men of the Nineveh shall stand up in the judgment with his generation and shall condemn it, for they repented at the preaching of Jonah, and lo! one greater than Jonah is here!
33 “Ọ dịghị onye na-amụnye oriọna dọnye ya nʼebe zoro ezo maọbụ nʼokpuru efere, kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
"When one lights a lamp he does not put it in a cellar nor under the bushel, but on a lamp-stand that those who enter may see the light.
34 Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị.
"The lamp of the body is your eye; when your eye is single then your whole body is full of light; but when it is evil your whole body is full of darkness.
35 Ya mere, lezie anya ka ị mara ka ìhè dị nʼime gị, ọ bụghị ọchịchịrị.
"Look carefully! Perhaps that very light of yours is darkness.
36 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.”
"If, however, your whole body is full of light, without having any part dark, it will be wholly radiant with light, as when the lamp illumines you with its bright rays."
37 Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri.
When he had finished speaking a Pharisee asked him to dine with him; so he went in with him and reclined.
38 O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe ọ bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupu ya ebido.
And the Pharisee noticed, to his amazement, that he did not wash his hands before eating,
39 Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Unu ndị Farisii na-asacha azụ iko mmiri na efere, mee ka ọ dị ọcha, ma ime unu jupụtara nʼanya ukwu na nʼihe ọjọọ dị iche iche.
but the Lord said to him. "You Pharisee do cleanse the outside of your cup or plate, but your secret heart is full of extortion and wickedness.
40 Ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya?
"Foolish men! Did not He who made the outside make the inside also?
41 Kama werenụ ihe ndị ahụ dị nʼime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara unu ọcha.
"Better cleanse what is within, and nothing will be unclean for you.
42 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, nʼihi na unu na-enye otu ụzọ nʼụzọ iri nʼihi mint, na mkpa akwụkwọ na-esi isi ụtọna mkpa akwụkwọ niile dị iche iche nke ubi, ma leghara ikpe ziri ezi na ịhụnanya nke Chineke anya. Ihe niile ndị a ka unu kwesiri ime nʼelegharaghị ihe ndị ọzọ anya.
"But woe unto you Pharisee! for you tithe mint and rue and every herb, and disregard justice and the love of God; but these you ought to have done, and not leave the other undone.
43 “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii! Nʼihi na unu na-ahụ ịnọ nʼisi oche niile nʼụlọ ekpere na ekele pụrụ iche a na-ekele unu nʼọma ahịa nʼanya.
"Woe unto you Pharisee! for you delight in the best seats in the synagogue, and in the salutation in the market-places.
44 “Ahụhụ ga-adịrị unu, nʼihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ihe, nke ndị mmadụ na-agafe nʼelu ha nʼihi na ha amaghị na ọ bụ ili.”
"Woe unto you! for you are like the tombs which are hidden, and men walk over them unsuspecting."
45 Nʼotu oge, otu onye ozizi iwu sịrị ya, “Onye ozizi, mgbe ị na-ekwu ihe ndị a, anyị sokwa na ndị ị na-akọcha.”
Hereupon one of the lawyers exclaimed, "But teacher, in saying such things you are also reproaching us also."
46 Ma ọ sịrị, “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu. Nʼihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli, ma unu onwe unu adịghị eweli ọ bụladị otu mkpịsịaka unu, ịmetụ ibu ahụ aka.
"Woe unto you lawyers also!" said Jesus, "for you load men with irksome burdens, and you yourselves will not touch the burdens with one of your fingers.
47 “Ahụhụ ga-adịrị unu nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma bụ ndị nna nna unu ha gburu.
"Woe to you! for you are building the tombs of the prophets whom you ancestors killed.
48 Ya mere, unu bụ ndị akaebe ma kwenyekwa nʼihe ndị nna nna unu ha mere, nʼihi ha gburu ha, ma unu e wuo ili ha.
"So you are witnesses, and you consent to the actions of your ancestors. for they killed them, and you build their tombs.
49 Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke nʼamamihe ya ji kwuo sị, Aga m ezigara ha ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ ka ha ga-egbu ma ndị ọzọkwa ka ha ga-akpagbu.
"For this reason also said the Wisdom of God. ‘I will send them prophets and apostles; some of them they will kill and some they will persecute;
50 Nʼihi nke a, ọgbọ a ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma niile a wufuru, site na mmalite nke ụwa,
"so that the blood of all the prophets which was shed from the foundation of the world may be required from this generation,
51 site nʼọbara Ebel ruo na nke Zekaraya, onye e gburu nʼetiti ebe ịchụ aja na ebe nsọ. E, agwa m unu, a ga-ajụ ihe banyere ha nʼaka ọgbọ a.
"from the blood of Abel to the blood of Zachariah, who perished between the alter and the sanctuary; yes; I tell you, it shall be required of this generation!
52 “Ahụhụ ga-adịrị unu bụ ndị ozizi iwu, nʼihi na unu wepụrụ ọtụghe igodo nke amamihe. Unu onwe unu abanyeghị, ma unu gbochikwara ndị na-abata ịbata.”
"Woe to you lawyers, for you have taken away the key of knowledge!’ You yourselves have not entered, and you have hindered those who are trying to enter."
53 Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, ndị ode akwụkwọ na ndị Farisii bidoro isogbu ya, na ịkpasu ya ikwu ọtụtụ okwu,
After he had gone away, the Scribes and the Pharisee began to set themselves vehemently against him, and to cross-question him upon many points,
54 na-esiri ya ọnya, ka ha mara ma ọ ga-ekwuhie ọnụ, ka ha hụ ihe ha ga-eji jide ya.
laying in wait for him, in order to catch a word from his lips.

< Luk 11 >