< Levitikọs 21 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Gwa ndị nchụaja, ụmụ ndị ikom Erọn okwu sị ha, ‘Onye nchụaja ekwesighị imerụ onwe ya mgbe mmadụ nwụrụ nʼetiti ụmụnna ya.
Mea ano a Ihowa ki a Mohi, Korero ki nga tohunga, ki nga tama a Arona, mea atu ki a ratou, Kaua tetahi e whakapoke i a ia mo te tupapaku o tona iwi:
2 Karịakwa ma onye ahụ bụ onye dị ya nnọọ nso, dịka nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị, maọbụ nwanne ya nwoke,
Engari mo tona whanaunga, mo te mea e tata ana ki a ia, mo tona whaea, mo tona papa, mo tana tama, mo tana tamahine, mo tona tuakana, teina ranei,
3 maọbụ nwanne ya nwanyị na-alụbeghị di, onye ọ na-elekọta nʼihi na o nweghị di. Nʼihi ya, o nwere ike merụọ onwe ya.
Mo tona tuahine hoki, ki te mea he wahine, he mea e tata ana ki a ia, a kahore ana tane: e ahei ana kia poke ia mona.
4 Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya.
Kaua ia, he ariki nei no tona iwi, e whakapoke i a ia kia noa.
5 “‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha.
Kaua e whakatiwhaia o ratou matenga, kaua hoki e heua nga taha o o ratou pahau, kaua ano hoki e haea to ratou kikokiko.
6 Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ.
Kia tapu ratou ki to ratou Atua, kaua hoki e whakanoatia te ingoa o to ratou Atua: no te mea ko ratou hei whakahere i nga whakahere ahi a Ihowa, i te kai a to ratou Atua: mo reira kia tapu ratou.
7 “‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha.
Kaua ratou e tango i te wahine kairau, i te mea noa ranei, hei wahine; kaua ano hoki ratou e tango i te wahine i whakarerea e tana tane: he tangata tapu hoki ia na tona Atua.
8 Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ.
Mo reira me whakatapu ia e koe, mana hoki e whakahere te kai a tou Atua: kia tapu ia ki a koe: he tapu hoki ahau, a Ihowa, tou kaiwhakatapu.
9 “‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ.
Me te tamahine hoki a tetahi tohunga, ki te whakanoa ia i a ia, ki te kairau, kua whakanoatia e ia tona papa: me tahu ki te ahi.
10 “‘Onyeisi nchụaja, onye ahụ sitere nʼetiti ụmụnna ya, onye awụsara mmanụ nsọ nʼisi ya, onye ahọrọ doo nsọ iyiri uwe onye nchụaja ahụ, agaghị ahapụ agịrị isi ya ka ọ kpasasịa, maọbụ dọwaa uwe ya.
Me te tino tohunga hoki i roto i ona teina, te tangata i ringihia nei tona matenga ki te hinu whakawahi, a i whakatohungatia hei kakahu i nga kakahu, kaua e tukua e ia ona makawe kia mahora noa, kaua ano hoki e haea ona kakahu;
11 Ọ gaghị abanye ebe ozu dị. Ọ gaghị emerụ onwe ya, ọ bụladị ma ozu ahụ ọ bụ nke nne ya maọbụ nke nna ya.
Kaua hoki ia e haere atu ki tetahi tupapaku mate, kaua ano hoki ia e whakapoke i a ia mo tona papa, mo tona whaea ranei;
12 Ọ gaghị esi nʼebe nsọ Chineke ya pụọ, maọbụ mee ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nʼihi na e doola ya nsọ site na ite ya mmanụ nsọ nke Chineke ya. Abụ m Onyenwe anyị.
Kaua hoki ia e haere ki waho o te wahi tapu, kei noa i a ia te wahi tapu o tona Atua; kei runga hoki i a ia te karauna o te hinu whakawahi o tona Atua: ko Ihowa ahau.
13 “‘Nwanyị onyeisi nchụaja ga-alụ ga-abụ nwanyị na-amaghị nwoke.
Me tango ano hoki e ia he wahine i tona wahinetanga.
14 Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya,
He pouaru, he wahine ranei i whakarerea, he wahine noa ranei, he wahine kairau ranei, kaua enei e tangohia e ia: engari me tango e ia he wahine i roto i tona iwi ake hei wahine.
15 ka ọ ghara ime ka ụmụ ya ghara ịdị nsọ nʼetiti ụmụnna ya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ya nsọ.’”
Kaua hoki e whakanoatia e ia ona uri roto i tona iwi: ko Ihowa hoki ahau te whakatapu nei i a ia.
16 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
I korero ano a Ihowa ki a Mohi, i mea,
17 “Gwa Erọn, ‘Nʼọgbọ niile nke na-abịa, o nweghị onye ọbụla nʼime ụmụ ụmụ gị nke akụkụ ahụ ya na-ezughị oke ga-abịa nso iwetara Chineke ya ihe oriri.
Korero ki a Arona, mea atu, Ki te mea he koha to tetahi o ou uri i o ratou whakatupuranga, kaua ia e whakatata mai ki te whakahere i te kai a tona Atua.
18 O nweghị nwoke ọbụla nwere ọrụsị ọbụla ga-abịa nso, o nweghị nwoke kpuru ìsì, maọbụ onye ngwụrọ, maọbụ onye imi mpịa, maọbụ onye ụkwụ maọbụ aka ya na-ezughị oke,
Kaua hoki e whakatata mai tetahi tangata he koha tona: te matapo, te kopa, te tangata he ihu parehe tona, i hira ake ranei tetahi wahi ona,
19 maọbụ onye ọkpụkpụ ụkwụ ya maọbụ ọkpụkpụ aka ya gbajiri,
Te tangata ranei i whati te waewae, i whati ranei te ringa,
20 maọbụ onye mkpumkpu azụ dị, maọbụ nwa akakpọ, maọbụ onye na-adịghị ahụzi ụzọ, maọbụ onye agba na-ata, maọbụ onye akpụkpa dị nʼahụ, maọbụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa.
Te tuara piko ranei, te mea i puwhenua te tupu, ki te papahewa ranei tona kanohi, ki te mea ranei he papaka, he hakihaki ranei tona, ki te mea ranei kua komurumurua ona mea;
21 O nweghị nwa nwa Erọn onye nchụaja ọbụla nwere ọrụsị ga-abịa iwetara Onyenwe anyị aja onyinye site nʼọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere ọrụsị, ọ gaghị abịa nso iwetara Chineke ya nri.
Kaua tetahi o nga uri o te tohunga, o Arona, ki te mea he koha tona, e whakatata mai ki te whakahere i nga whakahere ahi a Ihowa: he koha tona, kaua ia e whakatata ki te whakahere i te kai a tona Atua.
22 Ma o nwere ike iri nri ahụ dịkarịsịrị nsọ nke sitere na nri Chineke ya, tinyekwara nri ahụ dị nsọ.
Me kai e ia te kai a tona Atua, te mea tapu rawa, me te mea tapu.
23 Kama ọ gaghị abịa nso akwa mgbochi ahụ maọbụ bịaruo ebe ịchụ aja nso, nʼihi ezughị oke ya. Ka ọ ghara imerụ ebe nsọ m, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’”
Otiia kaua ia e haere ki te arai, e whakatata ranei ki te aata; he koha hoki tona; kei noa i a ia oku wahi tapu: ko Ihowa hoki ahau te whakatapu nei i a ratou.
24 Ya mere Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile iwu ndị a.
Ko nga korero enei a Mohi ki a Arona ratou ko ana tama, ki nga tama katoa ano hoki a Iharaira.

< Levitikọs 21 >