< Levitikọs 12 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
And the Lord said to Moses,
2 “Nye ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, ‘Mgbe nwanyị tụụrụ ime mesịa mụọ nwa nwoke, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, dịka o si adị mgbe ọ nọ nʼadịghị ọcha nke nsọ ya nʼoge a kara aka.
Say to the children of Israel, If a woman is with child and gives birth to a male child, she will be unclean for seven days, as when she is unwell.
3 Nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ya, a ga-ebi nwa nwoke ahụ ugwu.
And on the eighth day let him be given circumcision.
4 Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ọ ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka ọ dị ọcha gasịrị.
And she will be unclean for thirty-three days till the flow of her blood is stopped; no holy thing may be touched by her, and she may not come into the holy place, till the days for making her clean are ended.
5 Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha.
But if she gives birth to a female child, then she will be unclean for two weeks, as when she is unwell; and she will not be completely clean for sixty-six days.
6 “‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie.
And when the days are ended for making her clean for a son or a daughter, let her take to the priest at the door of the Tent of meeting, a lamb of the first year for a burned offering and a young pigeon or a dove for a sin-offering:
7 Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya. “‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị.
And the priest is to make an offering of it before the Lord and take away her sin, and she will be made clean from the flow of her blood. This is the law for a woman who gives birth to a male or a female.
8 Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’”
And if she has not money enough for a lamb, then let her take two doves or two young pigeons, one for a burned offering and the other for a sin-offering, and the priest will take away her sin and she will be clean,

< Levitikọs 12 >