< Abụ Akwa 4 >

1 Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile. 2 Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ. 3 Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara. 4 Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ. 5 Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 6 Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka. 7 Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa. 8 Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ. 9 Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi. 10 Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi. 11 Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile. 12 Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem. 13 Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya. 14 Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka. 15 Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, “O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.” 16 Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara. 17 Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị. 18 Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo. 19 Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị. 20 Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, ka ha jidere nʼọnya ha. Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, nʼetiti mba dị iche iche. 21 Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, onye nke bi nʼala Uz. Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ. 22 Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, kpugheekwa ajọ omume gị niile.

< Abụ Akwa 4 >