< Jona 2 >

1 Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere.
Jonah prayed to the Lord his God, out of the belly of the fish,
2 Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. (Sheol h7585)
and said: I cried out of my distress, to the Lord and he answered me; out of the midst of Sheol I cried aloud, and you heard my voice. (Sheol h7585)
3 Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi.
For you cast me into the deep, into heart of the seas, and the great flood rolled about me; all your breakers and your waves passed over me.
4 Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’
Then I said, I am driven out, away from your sight; How will I ever again look towards your holy temple?
5 Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
The waters surrounded me, the great deep engulfed me, the sea weeds were wrapped about my head.
6 Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
I went down to the roots of the mountains; the prison of the earth closed over me forever. Yet you brought up my life from destruction, O Lord my God.
7 “Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
As my life slipped away, I remembered the Lord; and my prayer reached you, in your holy temple.
8 “Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
Those who worship worthless idols abandon their own mercy,
9 Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’”
but I will sacrifice to you with loud thanksgiving! I will pay that which I have vowed. Salvation is the Lord’s.
10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
And the Lord spoke to the fish, and it threw up Jonah upon the dry land.

< Jona 2 >