< Job 9 >

1 Job zara sị:
Then Job answered,
2 “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke?
“Truly I know that it is so, but how can man be just with God?
3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya?
If he is pleased to contend with him, he can’t answer him one time in a thousand.
4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ?
God is wise in heart, and mighty in strength. Who has hardened himself against him and prospered?
5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, na-akwatụ ha nʼiwe ya.
He removes the mountains, and they don’t know it, when he overturns them in his anger.
6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, mee ka ogidi ya maa jijiji.
He shakes the earth out of its place. Its pillars tremble.
7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye.
He commands the sun and it doesn’t rise, and seals up the stars.
8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe, ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri.
He alone stretches out the heavens, and treads on the waves of the sea.
9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe.
He makes the Bear, Orion, and the Pleiades, and the rooms of the south.
10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta.
He does great things past finding out; yes, marvellous things without number.
11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya.
Behold, he goes by me, and I don’t see him. He passes on also, but I don’t perceive him.
12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’
Behold, he snatches away. Who can hinder him? Who will ask him, ‘What are you doing?’
13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya.
“God will not withdraw his anger. The helpers of Rahab stoop under him.
14 “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka?
How much less will I answer him, and choose my words to argue with him?
15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere.
Though I were righteous, yet I wouldn’t answer him. I would make supplication to my judge.
16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị.
If I had called, and he had answered me, yet I wouldn’t believe that he listened to my voice.
17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya.
For he breaks me with a storm, and multiplies my wounds without cause.
18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m.
He will not allow me to catch my breath, but fills me with bitterness.
19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya.
If it is a matter of strength, behold, he is mighty! If of justice, ‘Who,’ says he, ‘will summon me?’
20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara.
Though I am righteous, my own mouth will condemn me. Though I am blameless, it will prove me perverse.
21 “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị ejighị m onwe m kpọrọ ihe; nʼezie ana m eleda ndụ m anya.
I am blameless. I don’t respect myself. I despise my life.
22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, ‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’
“It is all the same. Therefore I say he destroys the blameless and the wicked.
23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị.
If the scourge kills suddenly, he will mock at the trial of the innocent.
24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya?
The earth is given into the hand of the wicked. He covers the faces of its judges. If not he, then who is it?
25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya.
“Now my days are swifter than a runner. They flee away. They see no good.
26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs, dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri.
They have passed away as the swift ships, as the eagle that swoops on the prey.
27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’
If I say, ‘I will forget my complaint, I will put off my sad face, and cheer up,’
28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha.
I am afraid of all my sorrows. I know that you will not hold me innocent.
29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara, nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu?
I will be condemned. Why then do I labour in vain?
30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m werekwa soda saa aka m abụọ,
If I wash myself with snow, and cleanse my hands with lye,
31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtị nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị.
yet you will plunge me in the ditch. My own clothes will abhor me.
32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe.
For he is not a man, as I am, that I should answer him, that we should come together in judgement.
33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya,
There is no umpire between us, that might lay his hand on us both.
34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ.
Let him take his rod away from me. Let his terror not make me afraid;
35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu; ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.
then I would speak, and not fear him, for I am not so in myself.

< Job 9 >