< Job 33 >

1 “Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m; ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu. 2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu; okwu m dịkwa nʼọnụ ire m. 3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m; egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma. 4 Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ. 5 Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike; jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka. 6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke; mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo. 7 Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ, ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị. 8 “Ma ị kwuola ya na ntị m, anụrụ m okwu ndị ahụ niile, 9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere; adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla. 10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ; ọ na-ahụta m dịka onye iro ya. 11 Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ; ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’ 12 “Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma, nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ. 13 Gịnị mere i ji na-ekpesara ya na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu? 14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya. 15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị, mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra, mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha. 16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntị ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị; 17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa, ka o si na nganga ya wezuga onwe ya, 18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu, chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha. 19 “Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina, ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu. 20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi, ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ. 21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi, ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a. 22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso, ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi. 23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ, dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ, onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya, 24 ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke, ‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili; achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya. 25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị, ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’ 26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya, ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ, ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya. 27 Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha: ‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume, ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m; 28 ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili, ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’ 29 “Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ. 30 Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili, ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya. 31 “Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m; dere jii ka m kwuo okwu. 32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m; kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume. 33 Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị; dere jii, ka m zi gị amamihe.”

< Job 33 >