< Job 30 >

1 “Ma ugbu a, ha na-akwa m emo bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ, bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta. 2 Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m, ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike? 3 Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ, ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị. 4 Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu, mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha. 5 A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha, a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi. 6 A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị. Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala. 7 Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ, na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi. 8 Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha, e sitere nʼala ahụ chụpụ ha. 9 “Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo; abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị. 10 Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso; ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu. 11 Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m, o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m. 12 Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha. Ha na-esiri ụkwụ m ọnya, ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m. 13 Ha na-etiwasị ụzọ m, ha kwadoro mmekpa ahụ m. ‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu. 14 Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi; nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ. 15 Oke egwu abịakwasịla m; ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru, nchekwa m agabigala dịka igwe ojii. 16 “Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga; ụbọchị ahụhụ ejidela m. 17 Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m, ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike. 18 Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe; ọ na-ekechi m dịka olu uwe m. 19 Ọ na-atụba m nʼime apịtị, mee ka m ghọọ ntụ na aja. 20 “Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m; anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m. 21 Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m. 22 Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe, ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri. 23 Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ. 24 “Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka. 25 Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu; ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye? 26 Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara; mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara. 27 Obi m anaghị ezu ike nʼime m; ụbọchị ahụhụ na-ezute m. 28 Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ. Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka. 29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa; onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị. 30 Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere; anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ. 31 Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ; ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.

< Job 30 >