< Job 29 >

1 Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị: 2 “Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga, dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m, 3 mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị. 4 Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma, mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi, 5 mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu, 6 mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ. 7 “Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo were ọnọdụ m nʼama. 8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha, ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha; 9 ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu ma were aka ha kpuchie ọnụ ha; 10 olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ, ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ. 11 Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m, ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m. 12 Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka, napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka. 13 Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m; emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ. 14 Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m. 15 Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ. 16 Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi. 17 Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume, si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu. 18 “Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala. 19 Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri, na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile. 20 Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m, ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’ 21 “Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m. 22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha. 23 Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo, na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị. 24 Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya; ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha. 25 Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha; ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya; na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.

< Job 29 >