< Jeremaya 29 >

1 Ihe ndị a bụ ihe dị nʼakwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jerusalem degaara ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị okenye, na ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị Izrel Nebukadneza dọtara nʼagha si na Jerusalem bulaa ha Babilọn.
Now these are the words of the letter that Jeremiah the prophet sent from Jerusalem to the residue of the elders of the captivity, and to the priests, to the prophets, and to all the people whom Nebuchadnezzar had carried away captive from Jerusalem to Babylon,
2 Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.
(after Jeconiah the king, the queen mother, the eunuchs, the princes of Judah and Jerusalem, the craftsmen, and the smiths had departed from Jerusalem),
3 Onye Jeremaya nyere akwụkwọ ozi a ka o nyeruo ndị e deere ya bụ Eleasa nwa Shefan, na Gemaraya nwa Hilkaya, ndị Zedekaya eze Juda zigara Babilọn izi Nebukadneza bụ eze ozi.
by the hand of Elasah the son of Shaphan and Gemariah the son of Hilkiah, (whom Zedekiah king of Judah sent to Babylon to Nebuchadnezzar king of Babylon). It said:
4 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-agwa ndị niile m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha buru laa Babilọn,
The LORD of Armies, the God of Israel, says to all the captives whom I have caused to be carried away captive from Jerusalem to Babylon:
5 “Wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya; kụọnụ ihe nʼubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya;
“Build houses and dwell in them. Plant gardens and eat their fruit.
6 lụọnụ nwunye, mụọkwanụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom; lụọkwaranụ ụmụ unu ndị ikom nwunye, kwenyekwanụ ka ụmụ unu ndị inyom lụọ di, ka ha mụọkwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Mụbaanụ nʼebe ahụ, unu ebilatakwala.
Take wives and father sons and daughters. Take wives for your sons, and give your daughters to husbands, that they may bear sons and daughters. Multiply there, and don’t be diminished.
7 Chọọnụ udo nke obodo ahụ m mere ka unu gaa biri nʼime ya. Kpeekwanụ ekpere nye Onyenwe anyị banyere ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ihe agaara obodo ahụ nke ọma, ọ ga-agakwara unu nke ọma.”
Seek the peace of the city where I have caused you to be carried away captive, and pray to the LORD for it; for in its peace you will have peace.”
8 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru, “Unu ekwela ka ndị amụma ahụ nọ nʼetiti unu, na ndị na-ajụ arụsị ase rafuo unu; unu egela ntị nʼakụkọ ha na-akọ banyere nrọ ndị ahụ unu na-akwagide ha ka ha rọọ.
For the LORD of Armies, the God of Israel says: “Don’t let your prophets who are amongst you and your diviners deceive you. Don’t listen to your dreams which you cause to be dreamt.
9 Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
For they prophesy falsely to you in my name. I have not sent them,” says the LORD.
10 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.
For the LORD says, “After seventy years are accomplished for Babylon, I will visit you and perform my good word towards you, in causing you to return to this place.
11 Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka Onyenwe anyị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
For I know the thoughts that I think towards you,” says the LORD, “thoughts of peace, and not of evil, to give you hope and a future.
12 Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị.
You shall call on me, and you shall go and pray to me, and I will listen to you.
13 Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
You shall seek me and find me, when you search for me with all your heart.
14 Aga m emekwa ka unu chọta m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “meekwa ka unu bụ ndị a dọtara nʼagha lọta. Aga m esitekwa na mba ahụ niile m chụgara unu chịkọtaa unu, kpọghachitekwa unu nʼebe ahụ m si chụpụ unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
I will be found by you,” says the LORD, “and I will turn again your captivity, and I will gather you from all the nations, and from all the places where I have driven you, says the LORD. I will bring you again to the place from where I caused you to be carried away captive.”
15 Unu pụrụ ị sị, “Onyenwe anyị akpọlite ndị amụma nye anyị na Babilọn.”
Because you have said, “The LORD has raised us up prophets in Babylon,”
16 Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere eze ahụ na-anọkwasị nʼocheeze Devid, na banyere ndị mmadụ niile fọdụrụ nʼobodo a, bụ ụmụnne unu ndị ahụ na-esoghị unu gaa ebe e mere ka ha ga biri na mba ọzọ.
the LORD says concerning the king who sits on David’s throne, and concerning all the people who dwell in this city, your brothers who haven’t gone with you into captivity,
17 E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata.
the LORD of Armies says: “Behold, I will send on them the sword, the famine, and the pestilence, and will make them like rotten figs that can’t be eaten, they are so bad.
18 Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ.
I will pursue after them with the sword, with the famine, and with the pestilence, and will deliver them to be tossed back and forth amongst all the kingdoms of the earth, to be an object of horror, an astonishment, a hissing, and a reproach amongst all the nations where I have driven them,
19 Nʼihi na ha egeghị ntị nʼokwu m, bụ okwu si nʼọnụ ndị ohu m bụ ndị amụma, ndị m zigaara ha mgbe mgbe. Ma unu onwe unu, ndị bi na mba ọzọ egekwaghị ntị nʼokwu m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
because they have not listened to my words,” says the LORD, “with which I sent to them my servants the prophets, rising up early and sending them; but you would not hear,” says the LORD.
20 Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu niile bụ ndị m mere ka e si na Jerusalem dọta nʼagha gaa Babilọn.
Hear therefore the LORD’s word, all you captives whom I have sent away from Jerusalem to Babylon.
21 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu banyere Ehab nwa Kolaya, na Zedekaya nwa Maaseia, ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m, “Aga m ewere ha nyefee nʼaka Nebukadneza bụ eze Babilọn. Ọ ga-etigbukwa ha nʼihu unu.
The LORD of Armies, the God of Israel, says concerning Ahab the son of Kolaiah, and concerning Zedekiah the son of Maaseiah, who prophesy a lie to you in my name: “Behold, I will deliver them into the hand of Nebuchadnezzar king of Babylon; and he will kill them before your eyes.
22 Nʼihi ha, ndị niile e si Juda dọta nʼagha buru gaa Babilọn ga na-ekwu okwu nkọcha sị, ‘Ka Onyenwe anyị mesokwa gị ụdị mmeso o mesoro Zedekaya na Ehab, ndị eze Babilọn tụnyere nʼọkụ nke regburu ha.’
A curse will be taken up about them by all the captives of Judah who are in Babylon, saying, ‘The LORD make you like Zedekiah and like Ahab, whom the king of Babylon roasted in the fire;’
23 Nʼihi na ha emeela ihe ndị jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel; ha na nwunye ndị agbataobi ha akwaala iko; ha esitekwala nʼaha m buo amụma ụgha, amụma nke m na-enyeghị ha iwu ibu. Amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu, nʼihi na ahụrụ m ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
because they have done foolish things in Israel, and have committed adultery with their neighbours’ wives, and have spoken words in my name falsely, which I didn’t command them. I am he who knows, and am witness,” says the LORD.
24 Gwa Shemaya onye Nehelam okwu sị ya,
Concerning Shemaiah the Nehelamite you shall speak, saying,
25 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “I dere akwụkwọ zigara ndị niile bi na Jerusalem, ha na Zefanaya nwa Maaseia onye nchụaja, na ndị nchụaja ndị ọzọ. Ị gwara Zefanaya okwu nʼakwụkwọ ahụ sị ya,
“The LORD of Armies, the God of Israel, says, ‘Because you have sent letters in your own name to all the people who are at Jerusalem, and to Zephaniah the son of Maaseiah, the priest, and to all the priests, saying,
26 ‘Onyenwe anyị ahọpụtala gị mee gị onye nchụaja ga-anọchi anya Jehoiada. Nʼihi ya, ị bụrụla onyeisi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya mere, o kwesiri ka i jide onye ara ọbụla na-akpọ onwe ya onye amụma, manye ya agbụ igwe nʼụkwụ, na nʼolu ya.
“The LORD has made you priest in the place of Jehoiada the priest, that there may be officers in the LORD’s house, for every man who is crazy and makes himself a prophet, that you should put him in the stocks and in shackles.
27 Gịnị mere i ji hapụ ịbasiri Jeremaya, onye Anatot mba ike, onye na-eme onwe ya onye amụma nʼetiti unu?
Now therefore, why have you not rebuked Jeremiah of Anathoth, who makes himself a prophet to you,
28 O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’”
because he has sent to us in Babylon, saying, The captivity is long. Build houses, and dwell in them. Plant gardens, and eat their fruit?”’”
29 Zefanaya bụ onye nchụaja, gụrụ akwụkwọ ozi ahụ nʼihu Jeremaya, bụ onye amụma.
Zephaniah the priest read this letter in the hearing of Jeremiah the prophet.
30 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jeremaya, sị,
Then the LORD’s word came to Jeremiah, saying,
31 “Zigara ndị ahụ niile e mere ka ha gaa biri na mba ọzọ ozi sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shemaya onye Nehelam, Ebe ọ bụ na Shemaya ebuorola unu amụma mee ka unu tụkwasị obi unu nʼokwu ụgha ya, ma ọ bụghị m ziri ya,
“Send to all of the captives, saying, ‘The LORD says concerning Shemaiah the Nehelamite: “Because Shemaiah has prophesied to you, and I didn’t send him, and he has caused you to trust in a lie,”
32 ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m aghaghị ịta Shemaya onye Nehelam na mkpụrụ ya ahụhụ nʼihi mmehie ya. Ọ gaghị enwe nwoke ọbụla ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị ya niile. Ọ gaghị esokwa unu lekwasị anya nʼihe ọma ahụ niile m na-akwado imere ndị m, nʼihi na o kwusara nnupu isi megide Onyenwe anyị. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’”
therefore the LORD says, “Behold, I will punish Shemaiah the Nehelamite and his offspring. He will not have a man to dwell amongst this people. He won’t see the good that I will do to my people,” says the LORD, “because he has spoken rebellion against the LORD.”’”

< Jeremaya 29 >