< Jeremaya 13 >

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.” 2 Ejere m zụta ajị ahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m. 3 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m, 4 “Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.” 5 Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m. 6 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.” 7 Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla. 8 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 9 “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem. 10 Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla. 11 Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12 Sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’ 13 Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem. 14 Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 15 Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya. 16 Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ. Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu; tupu unu akpọbie ụkwụ unu nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị. Unu na-ele anya ìhè ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị. Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ. 17 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha. 18 Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.” 19 A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ. 20 Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi? 21 Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme? 22 Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile. 23 Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe. 24 “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị. 25 Nke a bụ ihe unu fetara na nza, oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Nʼihi na unu echefuola m, tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche. 26 Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị. 27 Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị, na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile! Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile, nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa. Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem! Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”

< Jeremaya 13 >