< Aịzaya 56 >

1 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị, “Debenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ihe ziri ezi. Nʼihi na nzọpụta m dị nso, ezi omume m ga-apụta ihe mgbe na-adịghị anya.
The LORD says: “Maintain justice and do what is right, for my salvation is near and my righteousness will soon be revealed.
2 Ngọzị na-adịrị onye na-eme nke a, bụ onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike, onye ahụ nke na-edebe ụbọchị izuike m na-emerụghị ya, nke na-edebekwa aka ya ka ọ ghara ime ihe ọjọọ.”
Blessed is the man who does this, and the son of man who holds it fast; who keeps the Sabbath without profaning it and keeps his hand from doing any evil.”
3 Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”
Let no foreigner who has joined himself to the LORD speak, saying, “The LORD will surely separate me from his people.” Do not let the eunuch say, “Behold, I am a dry tree.”
4 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.
For the LORD says, “To the eunuchs who keep my Sabbaths, choose the things that please me, and hold fast to my covenant,
5 Aga m enye ha nʼime ụlọ m na nʼetiti mgbidi ya, ihe ncheta na aha dị mma karịa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. Aga m enye ha aha ga-adị ruo ebighị ebi nke a na-agaghị echezọ ruo ebighị ebi.
I will give them in my house and within my walls a memorial and a name better than of sons and of daughters. I will give them an everlasting name that will not be cut off.
6 Ma ndị mba ọzọ ndị gbakwuuru Onyenwe anyị ijere ya ozi, na ịhụ aha Onyenwe anyị nʼanya, nakwa ị bụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izuike nsọ na-emerụghị ya, na ndị jidesiri ọgbụgba ndụ m ike,
Also the foreigners who join themselves to the LORD to serve him, and to love the LORD’s name, to be his servants, everyone who keeps the Sabbath from profaning it, and holds fast my covenant,
7 ndị a ka m ga-akpọta nʼugwu nsọ m, meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime ụlọ ekpere m. Aga m anabata aja nsure ọkụ ha na onyinye niile ha nyere nʼebe ịchụ aja m. Nʼihi na a ga-akpọ ụlọ m Ụlọ Ekpere nye mba niile dị iche iche.”
I will bring these to my holy mountain, and make them joyful in my house of prayer. Their burnt offerings and their sacrifices will be accepted on my altar; for my house will be called a house of prayer for all peoples.”
8 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, bụ onye ahụ na-eme ka Izrel si nʼebe ha gbapụrụ ọsọ lọta, “Aga m achịkọtakwa ndị ọzọ tinyere ha tinyekọtara na ndị ya achịkọtarala.”
The Lord GOD, who gathers the outcasts of Israel, says, “I will yet gather others to him, in addition to his own who are gathered.”
9 Bịanụ, unu anụmanụ niile nke oke ọhịa. Bịanụ dọgbuo, unu ụmụ anụmanụ nke oke ọhịa.
All you animals of the field, come to devour, all you animals in the forest.
10 Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.
His watchmen are blind. They are all without knowledge. They are all mute dogs. They can’t bark— dreaming, lying down, loving to slumber.
11 Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke; ha adịghị enwe afọ ojuju. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta, ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha, onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.
Yes, the dogs are greedy. They can never have enough. They are shepherds who can’t understand. They have all turned to their own way, each one to his gain, from every quarter.
12 Onye ọbụla na-asị, “Bịa ka m weta mmanya, ka anyị ṅụjuokwa mmanya nʼaba nʼanya afọ anyị. Echi ga-adịkwa ka taa, ma ọ bụkwanụ dị mma karịa.”
“Come,” they say, “I will get wine, and we will fill ourselves with strong drink; and tomorrow will be as today, great beyond measure.”

< Aịzaya 56 >