< Aịzaya 41 >

1 Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu! Ka mba niile gbanwee ike ha. Ka ha pụta kwuo okwu. Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe.
“Keep silent before me, islands, and let the peoples renew their strength. Let them come near, then let them speak. Let’s meet together for judgement.
2 “Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.
Who has raised up one from the east? Who called him to his feet in righteousness? He hands over nations to him and makes him rule over kings. He gives them like the dust to his sword, like the driven stubble to his bow.
3 Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla. E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ.
He pursues them and passes by safely, even by a way that he had not gone with his feet.
4 Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya, na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite? Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile, onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.”
Who has worked and done it, calling the generations from the beginning? I, the LORD, the first, and with the last, I am he.”
5 Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu; ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji. Ha zukọtara bịa nso.
The islands have seen, and fear. The ends of the earth tremble. They approach, and come.
6 Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị, “Nwee obi ike.”
Everyone helps his neighbour. They say to their brothers, “Be strong!”
7 Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.
So the carpenter encourages the goldsmith. He who smooths with the hammer encourages him who strikes the anvil, saying of the soldering, “It is good;” and he fastens it with nails, that it might not totter.
8 “Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.
“But you, Israel, my servant, Jacob whom I have chosen, the offspring of Abraham my friend,
9 Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.
you whom I have taken hold of from the ends of the earth, and called from its corners, and said to you, ‘You are my servant. I have chosen you and have not cast you away.’
10 Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
Don’t you be afraid, for I am with you. Don’t be dismayed, for I am your God. I will strengthen you. Yes, I will help you. Yes, I will uphold you with the right hand of my righteousness.
11 “Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.
Behold, all those who are incensed against you will be disappointed and confounded. Those who strive with you will be like nothing, and shall perish.
12 Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.
You will seek them, and won’t find them, even those who contend with you. Those who war against you will be as nothing, as a nonexistent thing.
13 Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’
For I, the LORD your God, will hold your right hand, saying to you, ‘Don’t be afraid. I will help you.’
14 Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
Don’t be afraid, you worm Jacob, and you men of Israel. I will help you,” says the LORD. “Your Redeemer is the Holy One of Israel.
15 “Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze. Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha, meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka.
Behold, I have made you into a new sharp threshing instrument with teeth. You will thresh the mountains, and beat them small, and will make the hills like chaff.
16 Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.
You will winnow them, and the wind will carry them away, and the whirlwind will scatter them. You will rejoice in the LORD. You will glory in the Holy One of Israel.
17 “Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ.
The poor and needy seek water, and there is none. Their tongue fails for thirst. I, the LORD, will answer them. I, the God of Israel, will not forsake them.
18 Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
I will open rivers on the bare heights, and springs in the middle of the valleys. I will make the wilderness a pool of water, and the dry land springs of water.
19 Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,
I will put cedar, acacia, myrtle, and oil trees in the wilderness. I will set cypress trees, pine, and box trees together in the desert;
20 ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.
that they may see, know, consider, and understand together, that the LORD’s hand has done this, and the Holy One of Israel has created it.
21 “Wepụtanụ mkpesa unu,” ka Onyenwe anyị sịrị, “Doo okwu unu nʼusoro,” ka Eze nke Jekọb na-asịkwa.
Produce your cause,” says the LORD. “Bring out your strong reasons!” says the King of Jacob.
22 “Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị, ihe gaje ime. Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara, ka anyị nwee ike tulee ha matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha. Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa,
“Let them announce and declare to us what will happen! Declare the former things, what they are, that we may consider them, and know the latter end of them; or show us things to come.
23 gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.
Declare the things that are to come hereafter, that we may know that you are gods. Yes, do good, or do evil, that we may be dismayed, and see it together.
24 Ma unu dị nta karịa ihe efu. Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru. Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ.
Behold, you are nothing, and your work is nothing. He who chooses you is an abomination.
25 “Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.
“I have raised up one from the north, and he has come, from the rising of the sun, one who calls on my name, and he shall come on rulers as on mortar, and as the potter treads clay.
26 O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla.
Who has declared it from the beginning, that we may know? and before, that we may say, ‘He is right’? Surely, there is no one who declares. Surely, there is no one who shows. Surely, there is no one who hears your words.
27 Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.
I am the first to say to Zion, ‘Behold, look at them;’ and I will give one who brings good news to Jerusalem.
28 Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ. O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ; o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha.
When I look, there is no man, even amongst them there is no counsellor who, when I ask, can answer a word.
29 Lee, ha niile bụ ụgha! Ọrụ ha niile pụtara ihe efu, arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.
Behold, all of their deeds are vanity and nothing. Their molten images are wind and confusion.

< Aịzaya 41 >