< Habakuk 2 >

1 Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m, guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ. Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m, na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a. 2 Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị, “Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. Depụta ya nke ọma, ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. 3 Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka. 4 “Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ. 5 Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. (Sheol h7585) 6 “Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’ 7 Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede? Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji? Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ. 8 Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche, ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ, i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha. 9 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa. 10 I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ, sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere. 11 Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị. Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ. 12 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo, nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike. 13 Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi? 14 Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 15 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. 16 Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị. 17 Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha. 18 “Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere. 19 Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ O nwere ike izi mmadụ ihe? Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.” 20 Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya. Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.

< Habakuk 2 >