< Habakuk 2 >

1 Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m, guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ. Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m, na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a.
I will stand at my watch and set myself on the ramparts, and will look out to see what he will say to me, and what I will answer concerning my complaint.
2 Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị, “Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. Depụta ya nke ọma, ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya.
The LORD answered me, “Write the vision, and make it plain on tablets, that he who runs may read it.
3 Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka.
For the vision is yet for the appointed time, and it hurries towards the end, and won’t prove false. Though it takes time, wait for it, because it will surely come. It won’t delay.
4 “Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ.
Behold, his soul is puffed up. It is not upright in him, but the righteous will live by his faith.
5 Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. (Sheol h7585)
Yes, moreover, wine is treacherous: an arrogant man who doesn’t stay at home, who enlarges his desire as Sheol; he is like death and can’t be satisfied, but gathers to himself all nations and heaps to himself all peoples. (Sheol h7585)
6 “Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’
Won’t all these take up a parable against him, and a taunting proverb against him, and say, ‘Woe to him who increases that which is not his, and who enriches himself by extortion! How long?’
7 Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede? Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji? Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ.
Won’t your debtors rise up suddenly, and wake up those who make you tremble, and you will be their victim?
8 Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche, ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ, i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha.
Because you have plundered many nations, all the remnant of the peoples will plunder you because of men’s blood, and for the violence done to the land, to the city and to all who dwell in it.
9 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.
Woe to him who gets an evil gain for his house, that he may set his nest on high, that he may be delivered from the hand of evil!
10 I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ, sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere.
You have devised shame to your house by cutting off many peoples, and have sinned against your soul.
11 Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị. Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ.
For the stone will cry out of the wall, and the beam out of the woodwork will answer it.
12 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo, nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike.
Woe to him who builds a town with blood, and establishes a city by iniquity!
13 Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?
Behold, isn’t it from the LORD of Armies that the peoples labour for the fire, and the nations weary themselves for vanity?
14 Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
For the earth will be filled with the knowledge of the LORD’s glory, as the waters cover the sea.
15 “Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.
“Woe to him who gives his neighbour drink, pouring your inflaming wine until they are drunk, so that you may gaze at their naked bodies!
16 Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.
You are filled with shame, and not glory. You will also drink and be exposed! The cup of the LORD’s right hand will come around to you, and disgrace will cover your glory.
17 Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha.
For the violence done to Lebanon will overwhelm you, and the destruction of the animals will terrify you, because of men’s blood and for the violence done to the land, to every city and to those who dwell in them.
18 “Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.
“What value does the engraved image have, that its maker has engraved it; the molten image, even the teacher of lies, that he who fashions its form trusts in it, to make mute idols?
19 Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ O nwere ike izi mmadụ ihe? Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.”
Woe to him who says to the wood, ‘Awake!’ or to the mute stone, ‘Arise!’ Shall this teach? Behold, it is overlaid with gold and silver, and there is no breath at all within it.
20 Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya. Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.
But the LORD is in his holy temple. Let all the earth be silent before him!”

< Habakuk 2 >