< Jenesis 49 >

1 Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.
Jacob called to his sons, and said: “Gather yourselves together, that I may tell you that which will happen to you in the days to come.
2 “Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.
Assemble yourselves, and hear, you sons of Jacob. Listen to Israel, your father.
3 “Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.
“Reuben, you are my firstborn, my might, and the beginning of my strength, excelling in dignity, and excelling in power.
4 Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.
Boiling over like water, you shall not excel, because you went up to your father’s bed, then defiled it. He went up to my couch.
5 “Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.
“Simeon and Levi are brothers. Their swords are weapons of violence.
6 Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
My soul, don’t come into their council. My glory, don’t be united to their assembly; for in their anger they killed men. In their self-will they hamstrung cattle.
7 Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
Cursed be their anger, for it was fierce; and their wrath, for it was cruel. I will divide them in Jacob, and scatter them in Israel.
8 “Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
“Judah, your brothers will praise you. Your hand will be on the neck of your enemies. Your father’s sons will bow down before you.
9 Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
Judah is a lion’s cub. From the prey, my son, you have gone up. He stooped down, he crouched as a lion, as a lioness. Who will rouse him up?
10 Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
The sceptre will not depart from Judah, nor the ruler’s staff from between his feet, until he comes to whom it belongs. The obedience of the peoples will be to him.
11 Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
Binding his foal to the vine, his donkey’s colt to the choice vine, he has washed his garments in wine, his robes in the blood of grapes.
12 Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi.
His eyes will be red with wine, his teeth white with milk.
13 “Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.
“Zebulun will dwell at the haven of the sea. He will be for a haven of ships. His border will be on Sidon.
14 “Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.
“Issachar is a strong donkey, lying down between the saddlebags.
15 Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.
He saw a resting place, that it was good, the land, that it was pleasant. He bows his shoulder to the burden, and becomes a servant doing forced labour.
16 “Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.
“Dan will judge his people, as one of the tribes of Israel.
17 Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.
Dan will be a serpent on the trail, an adder in the path, that bites the horse’s heels, so that his rider falls backward.
18 “O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.
I have waited for your salvation, LORD.
19 “Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.
“A troop will press on Gad, but he will press on their heel.
20 “Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma.
“Asher’s food will be rich. He will produce royal dainties.
21 “Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ, nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma.
“Naphtali is a doe set free, who bears beautiful fawns.
22 “Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.
“Joseph is a fruitful vine, a fruitful vine by a spring. His branches run over the wall.
23 Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
The archers have severely grieved him, shot at him, and persecuted him:
24 Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel,
But his bow remained strong. The arms of his hands were made strong, by the hands of the Mighty One of Jacob, (from there is the shepherd, the stone of Israel),
25 nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa.
even by the God of your father, who will help you, by the Almighty, who will bless you, with blessings of heaven above, blessings of the deep that lies below, blessings of the breasts, and of the womb.
26 Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.
The blessings of your father have prevailed above the blessings of my ancestors, above the boundaries of the ancient hills. They will be on the head of Joseph, on the crown of the head of him who is separated from his brothers.
27 “Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”
“Benjamin is a ravenous wolf. In the morning he will devour the prey. At evening he will divide the plunder.”
28 Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.
All these are the twelve tribes of Israel, and this is what their father spoke to them, and blessed them. He blessed everyone according to his own blessing.
29 Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.
He instructed them, and said to them, “I am to be gathered to my people. Bury me with my fathers in the cave that is in the field of Ephron the Hittite,
30 Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.
in the cave that is in the field of Machpelah, which is before Mamre, in the land of Canaan, which Abraham bought with the field from Ephron the Hittite as a burial place.
31 Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.
There they buried Abraham and Sarah, his wife. There they buried Isaac and Rebekah, his wife, and there I buried Leah:
32 Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”
the field and the cave that is therein, which was purchased from the children of Heth.”
33 Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.
When Jacob finished charging his sons, he gathered up his feet into the bed, breathed his last breath, and was gathered to his people.

< Jenesis 49 >