< Jenesis 42 >

1 Ugbu a, Jekọb nụrụ na ọka dị nʼIjipt. Ọ sịrị ụmụ ya, “Kedụ ihe anyị jiri nọrọ na-elerịta onwe anyị anya”
Now Jacob became aware that there was grain in Egypt. He said to his sons, “Why do you look at one another?”
2 Ọ sịrị, “Lee anụrụ m na ọka dị nʼIjipt. Gbadatanụ nʼebe ahụ zụtara anyị ọka ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ.”
He said, “See here, I have heard that there is grain in Egypt. Go down there and buy for us from there so we may live and not die.”
3 Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka.
Joseph's ten brothers went down to buy grain from Egypt.
4 Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya.
But Benjamin, Joseph's brother, Jacob did not send with his brothers, for he feared that harm might come to him.
5 Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan.
The sons of Israel came to buy among those who came, for the famine was in the land of Canaan.
6 Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef.
Now Joseph was the governor over the land. He was the one who sold to all the people of the land. Joseph's brothers came and bowed down to him with their faces to the ground.
7 Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?” Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.”
Joseph saw his brothers and recognized them, but he disguised himself to them and spoke harshly with them. He said to them, “Where have you come from?” They said, “From the land of Canaan to buy food.”
8 Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ.
Joseph recognized his brothers, but they did not recognize him.
9 Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.”
Then Joseph remembered the dreams he had dreamed about them, and he said to them, “You are spies! You have come to see the undefended parts of the land.”
10 Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri.
They said to him, “No, my master. Your servants have come to buy food.
11 Anyị niile bụ ụmụ otu nna. Ndị ohu gị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Anyị abụghị ndị nnyopụta.”
We are all one man's sons. We are honest men. Your servants are not spies.”
12 Ma Josef gwara ha sị, “Mba! Unu bịara ịchọpụta akụkụ obodo anyị nke a na-echezighị nke ọma.”
He said to them, “No, you have come to see the undefended parts of the land.”
13 Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ. Ọ bụkwa otu nna mụrụ anyị niile. Nna anyị na nwanne anyị nta, onye ikpeazụ ọ mụrụ nọ na Kenan ugbu a. Ma otu onye nʼime anyị anwụọla.”
They said, “We your servants are twelve brothers, the sons of one man in the land of Canaan. See, the youngest is this day with our father, and one brother is no longer alive.”
14 Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu.
Joseph said to them, “It is what I said to you; you are spies.
15 Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a.
By this you will be tested. By the life of Pharaoh, you will not leave here, unless your youngest brother comes here.
16 Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.”
Send one of yourselves and let him get your brother. You will remain in prison, that your words may be tested, whether there is truth in you.”
17 O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ.
He put them all in custody for three days.
18 Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke.
Joseph said to them on the third day, “Do this and live, for I fear God.
19 Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ.
If you are honest men, let one of your brothers be confined in this prison, but you go, carry grain for the famine of your houses.
20 Ma kpọtaranụ m nwanne unu nke nta nʼebe a, nke a ga-egosi na okwu unu bụ eziokwu, na unu agaghịkwa anwụ.” Ha mere otu a.
Bring your youngest brother to me so your words will be verified and you will not die.” So they did so.
21 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Nʼezie, ọ bụ nʼihi nwanne anyị nwoke ka ahụhụ ndị a ji abịakwasị anyị. Anyị hụrụ obi mgbawa ya, mgbe ọ na-arịọ ka anyị chebe ndụ ya, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpa ahụ ndị a ji bịakwasị anyị ugbu a.”
They said to one another, “We are truly guilty concerning our brother in that we saw the distress of his soul when he pleaded with us and we would not listen. Therefore this distress has come upon us.”
22 Ruben zara sị ha, “Ọ bụ na mụ agwaghị unu sị unu hapụ imejọ nwantakịrị ahụ, ma unu egeghị ntị? Ugbu a, anyị na-asa ajụjụ banyere ọbara ya.”
Reuben answered them, “Did I not tell you, 'Do not sin against the boy,' but you would not listen? Now, see, his blood is required of us.”
23 Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha.
They did not know that Joseph understood them, for there was an interpreter between them.
24 O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya.
He turned from them and wept. He returned to them and spoke to them. He took Simeon from among them and bound him before their eyes.
25 Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a,
Then Joseph commanded his servants to fill his brothers' bags with grain, and to put every man's money back into his sack, and to give them provisions for the journey. It was done for them.
26 ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa.
The brothers loaded their donkeys with their grain and departed from there.
27 Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya.
As one of them opened his sack to give his donkey feed in the lodging place, he saw his money. Behold, it was in the opening of his sack.
28 Ọ gwara ụmụnne ya sị, “Lee, e tighachiri ego m kwụrụ. Lee ya nʼakpa ọka m.” Ike gwụrụ onye ọbụla nʼime ha. Site nʼahụ ịma jijiji ha lerịtara onwe ha anya sị, “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?”
He said to his brothers, “My money has been put back. Look at it; it is in my sack.” Their hearts sank and they turned trembling to one another, saying, “What is this that God has done to us?”
29 Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị,
They went to Jacob, their father in the land of Canaan and told him all that had happened to them. They said,
30 “Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha.
“The man, the lord of the land, spoke roughly with us and thought that we were spies in the land.
31 Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo.
We said to him, 'We are honest men. We are not spies.
32 Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’
We are twelve brothers, sons of our father. One is no longer alive, and the youngest is this day with our father in the land of Canaan.'
33 “Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu.
The man, the lord of the land, said to us, 'By this I will know that you are honest men. Leave one of your brothers with me, take grain for the famine in your houses, and go your way.
34 Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’”
Bring your youngest brother to me. Then I will know that you are not spies, but that you are honest men. Then I will release your brother to you, and you will trade in the land.'”
35 Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu.
It came about as they emptied their sacks, that, behold, every man's bag of silver was in his sack. When they and their father saw their bags of silver, they were afraid.
36 Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!”
Jacob their father said to them, “You have bereaved me of my children. Joseph is no longer alive, Simeon is gone, and you will take Benjamin away. All these things are against me.”
37 Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.”
Reuben spoke to his father, saying, “You may kill my two sons if I do not bring Benjamin back to you. Put him in my hands, and I will bring him to you again.”
38 Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.” (Sheol h7585)
Jacob said, “My son will not go down with you. For his brother is dead and he alone is left. If harm comes to him on the road in which you go, then you will bring down my gray hair with sorrow to Sheol.” (Sheol h7585)

< Jenesis 42 >