< Ndị Galeshịa 3 >

1 Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst.
Bhagalatia bhajinga, lihu leleku la uovu lalibhahalibu? Je Yesu Kristu alasibhu lepi katya msulubibwa palongolo pa mihu gha yhomo?
2 Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?
Nene nilonda tu kumanya ele kuhomela kwa muenga. Je mwapokili Roho kwa matendo gha Sheria au ndo mwaamini kela kamwapeliki?
3 Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ?
Ko, muenga ni bhajinga kiasi ekhe? ko mwayandili mu Roho ili mmalai mu mbhele?
4 Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu?
Ko mwatesiki kwa mambo mingi mebhwa, katya kueli ghayele gha mebhwa?
5 Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?
Ko muene yaipisya Roho kwa muenga ni kubhomba matendo gha nghofo kwa yhomo iketa kwa matendo gha sheria au kwa kup'etela pamonga ni imani?
6 Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.
Abraham “Amwamini K'yara ahesabibhu kujo mwenye haki”.
7 Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham.
Kwa namna yela yela muyelewahi ya ndabha, bhala bhabhiamini yakuwa ni bhana bha Abraham.
8 Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.”
Liyandiku latabilibhu yakuwa K'yara ngabhahesabili haki bhanu bha mataifa kwa njela ya imani. Injili yahubilibhu hosi kwa Abraham:”Kwa bhebhe mataifa ghoa ghibalikibhwa”.
9 Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị.
Ili kabhele bhabhayele niimani bhabalikibhuayi pamonga ni Abraham, yaayele ni imani.
10 Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.”
Bhala bhoa bhabhitegemela matendo gha sheria bhayele pasi mu laana. Kwa ndabha iyandikibhu, “Alanibhu kila munu yaishikamanahee ni mambo ghoa ghaghayandikibhu mukitabu ka sheria, kughabhomba ghoa.”
11 Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”
Henu ndo bhuasi yakuwa K'yara akamwesabilahee haki hata immonga musheria, kwa ndabha, “Yaayele ni haki alaishi ki imani”
12 Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.”
Sheria yihomelahe ni imani, Badala yaki “Yaifwanyai mambo agha kup'etela sheria, alaishi kisheria”.
13 Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.”
istu atukombhuili tete kuhomela mu laana ya sheria yapayafwanyikai laana kwajia yhoto. Kwa ndabha iyandikibhu, “Alanibhuayi” kila munu yaibinai munani mulibehe.”
14 Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ.
Lilengo layele ya ndabha, baraka ambasyo sasa yele kwa Ibrahimu ngasaidai kwa bhanu bhamataifa kup'etela Yesu Kristu, yakuwa tubhwesyai kuyhopa ahadi ya Roho kup'etela imani.
15 Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a.
Ndongo, nikabhajobhela na kibinadamu. Kabhele magono ambapo agano la kibinadamu palimalikai kubhekibhwa imara, ayelepi yaibhwesyai kupuuza au kuyongesela.
16 Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst.
Henu ahadi sajobhibhu kwa Ibrahimu ni kizazikya muene. Yijobhahee, “Kwa vizazi,” kumaanisya bhingi, badala yaki kwa mmonga yumuene, “Kwa kizazi kyako,” ambaye ndo Kristu.
17 Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga.
Henu nijobha nah, sheria ya yahidili miaka 430 badaye, yibhosya lepi agano la kunyuma lalibheki bhusima ni K'yara.
18 Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya.
Yandabha kujo ulisi ngawahidili ki njela ya sheria, ngaiyelepi kabhele kuhida kwa njela ya ahadi. Ndabha K'yara apisili mebhwa kwa Ibrahimu kwa njela ya ahadi.
19 Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire.
Kwandayakiki henu sheria yapisibhu? Yayongisibhu ndabha ya makosa, mpaka mzao wa Ibrahimu ulota kwa bhala ambabho kwa bhene amalili kuhaidibhwa. Sheria yabhekibhu ki shinikizo kup'etela malaika kwa kibhoko Kya kupatanisya.
20 Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma Chineke bụ otu.
Henu mpatanishi imaanisya zaidi ya munu mmonga, ndo K'yara yumuene.
21 Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu.
Kwa ele ko sheria iyele kinyume ni ahadi sa K'yara? La hasha! kwa ndabha sheria yaiyele ipisibhu iyele ni ubhueso wa kuleta usima, haki ngaipatikene kwa sheria.
22 Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
Badala yaki, liyandiku lifungili mambo ghoa pasi mu thambi. K'yara aketili naa ili ya ndabha ahadi ya muene ya kutookola tete kwa imani kup'etela Yesu Kristu lbhuesyai kupatikana kwa bhala bhabhiamini.
23 Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè.
Kabula ya imani ya Kristu kuhida, twayele tufungibhu ni kuya pasi pa sheria hadi pawihidai ufunuo was imani.
24 Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe.
Kwa ele sheria yafwanyiki kwa kiongozi wa yhoto hadi Kristu pahaaidayi, ndabha tuhesabibhuayi mu haki ni mwimani.
25 Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ.
Henu yandabha imani ihidili, tuyelepi kabhele pasi pabha angalizi.
26 Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs.
Kwa ndabha muenga mwabhoa ndo bhana bha K'yara kup'etela imani ni Kristu Yesu.
27 Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.
Mwabhoa bhambatizibhu kup'etela Kristu mmjifwekili Kristu.
28 E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs.
Ayelepi Myaudi wala Myunani, n'tumwa wala huru, bhagosi wala bhadala, kwandabha muenga mwabhoa n'do bhamonga kup'etela Kristu Yesu.
29 Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.
Kama muenga ndo bha Kristu, basi ndo uzao wa Ibrahimu, bharithi mu jibu wa ahadi.

< Ndị Galeshịa 3 >