< Izikiel 6 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
The LORD’s word came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, chee iru gị nʼugwu niile nke nʼIzrel, buo amụma megide ha,
“Son of man, set your face towards the mountains of Israel, and prophesy to them,
3 sị, ‘Unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị nye ugwu ukwu na ugwu nta niile, na iyi mmiri niile, na ndagwurugwu niile. Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, ga-eme ka agha bịakwasị unu, aga m ebibikwa ebe dị iche iche unu na-achụ aja.
and say, ‘You mountains of Israel, hear the word of the Lord GOD! The Lord GOD says to the mountains and to the hills, to the watercourses and to the valleys: “Behold, I, even I, will bring a sword on you, and I will destroy your high places.
4 A ga-etikpọ ebe ịchụ aja unu, tipịa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Aga m atụsa ndị unu e gburu egbu nʼihu arụsị unu.
Your altars will become desolate, and your incense altars will be broken. I will cast down your slain men before your idols.
5 Aga m atọgbọ ozu ndị Izrel nʼihu arụsị ha. Aga m aghasakwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụ aja unu.
I will lay the dead bodies of the children of Israel before their idols. I will scatter your bones around your altars.
6 Ebe ọbụla unu bi, a ga-etikpọ obodo ndị ahụ, tipịakwa ebe ịchụ aja niile, si otu a mee ka ebe ịchụ aja unu ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu. A ga-etipịakwa arụsị unu, kụjiekwa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ihe niile unu ji aka unu mepụta ka a ga-ekpochapụkwa.
In all your dwelling places, the cities will be laid waste and the high places will be desolate, so that your altars may be laid waste and made desolate, and your idols may be broken and cease, and your incense altars may be cut down, and your works may be abolished.
7 Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
The slain will fall amongst you, and you will know that I am the LORD.
8 “‘Ma aga m eme ka ụfọdụ nʼime ndị m fọdụ. Ndị ahụ fọdụrụ ga-esi nʼihu mma agha gbapụ, gbasasịa nʼala niile, na mba niile nke ụwa.
“‘“Yet I will leave a remnant, in that you will have some that escape the sword amongst the nations, when you are scattered through the countries.
9 Mgbe ha nọ dịka ndị a dọtara nʼagha na mba ọzọ, ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ga-echeta m. Ha ga-echeta otu ha si jiri obi nke ịkwa iko jupụtara nʼime ya, nke si nʼebe m nọ wezuga onwe ya, na anya nke na-agbaso arụsị ha, mee ka obi jọọ m njọ. Ha ga-akpọ onwe ha asị nʼihi ihe ọjọọ ndị ahụ ha mere, ya na ọchụchụ aja rụrụ arụ ha chụrụ.
Those of you that escape will remember me amongst the nations where they are carried captive, how I have been broken with their lewd heart, which has departed from me, and with their eyes, which play the prostitute after their idols. Then they will loathe themselves in their own sight for the evils which they have committed in all their abominations.
10 Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, matakwa na mgbe m gwara ha na ihe ndị a niile gaje ịbịakwasị ha, na ọ bụghị okwu efu ka m kwuru.
They will know that I am the LORD. I have not said in vain that I would do this evil to them.”’
11 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, kụkọọ ọbọ aka gị abụọ ọnụ, zọkwaa ụkwụ gị nʼala, ma tisikwaa mkpu akwa ike site nʼobi mwute, nʼihi ihe ọjọọ niile na omume rụrụ arụ ndị Izrel mere. Nʼihi na ha ga ịla nʼiyi site nʼoke ụnwụ, na site nʼagha, na site nʼọrịa na-efe efe.
“The Lord GOD says: ‘Strike with your hand, and stamp with your foot, and say, “Alas!”, because of all the evil abominations of the house of Israel; for they will fall by the sword, by the famine, and by the pestilence.
12 Ndị nọ nʼebe dị anya ga-anwụ site nʼọrịa na-efe efe, ndị nọ nso ga-anwụ site na mma agha, ndị fọdụrụ ndụ ga-anwụ site nʼagụụ. Aga m eme ka ha nụrụ ụfụ oke iwe m.
He who is far off will die of the pestilence. He who is near will fall by the sword. He who remains and is besieged will die by the famine. Thus I will accomplish my wrath on them.
13 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha.
You will know that I am the LORD when their slain men are amongst their idols around their altars, on every high hill, on all the tops of the mountains, under every green tree, and under every thick oak—the places where they offered pleasant aroma to all their idols.
14 E, aga m esetipụ aka m megide ha, mee ka ala ha laa nʼiyi, nʼebe niile ha bi, site nʼọzara ruo na Ribla. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
I will stretch out my hand on them and make the land desolate and waste, from the wilderness towards Diblah, throughout all their habitations. Then they will know that I am the LORD.’”

< Izikiel 6 >