< Izikiel 46 >

1 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọnụ ụzọ ama nke ogige ime, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ ga-abụ ihe e mechiri emechi nʼụbọchị isii niile unu na-arụ ọrụ. Ma a ga-emeghe ya nʼụbọchị izuike, na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
“‘The Lord GOD says: “The gate of the inner court that looks towards the east shall be shut the six working days; but on the Sabbath day it shall be opened, and on the day of the new moon it shall be opened.
2 Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.
The prince shall enter by the way of the porch of the gate outside, and shall stand by the post of the gate; and the priests shall prepare his burnt offering and his peace offerings, and he shall worship at the threshold of the gate. Then he shall go out, but the gate shall not be shut until the evening.
3 Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee Onyenwe anyị ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ.
The people of the land shall worship at the door of that gate before the LORD on the Sabbaths and on the new moons.
4 Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ.
The burnt offering that the prince shall offer to the LORD shall be on the Sabbath day, six lambs without defect and a ram without defect;
5 Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya.
and the meal offering shall be an ephah for the ram, and the meal offering for the lambs as he is able to give, and a hin of oil to an ephah.
6 Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla.
On the day of the new moon it shall be a young bull without defect, six lambs, and a ram. They shall be without defect.
7 Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa.
He shall prepare a meal offering: an ephah for the bull, and an ephah for the ram, and for the lambs according as he is able, and a hin of oil to an ephah.
8 Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.
When the prince enters, he shall go in by the way of the porch of the gate, and he shall go out by its way.
9 “‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ.
“‘“But when the people of the land come before the LORD in the appointed feasts, he who enters by the way of the north gate to worship shall go out by the way of the south gate; and he who enters by the way of the south gate shall go out by the way of the north gate. He shall not return by the way of the gate by which he came in, but shall go out straight before him.
10 Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ.
The prince shall go in with them when they go in. When they go out, he shall go out.
11 Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla.
“‘“In the feasts and in the appointed holidays, the meal offering shall be an ephah for a bull, and an ephah for a ram, and for the lambs as he is able to give, and a hin of oil to an ephah.
12 “‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.
When the prince prepares a free will offering, a burnt offering or peace offerings as a free will offering to the LORD, one shall open for him the gate that looks towards the east; and he shall prepare his burnt offering and his peace offerings, as he does on the Sabbath day. Then he shall go out; and after his going out one shall shut the gate.
13 “‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya.
“‘“You shall prepare a lamb a year old without defect for a burnt offering to the LORD daily. Morning by morning you shall prepare it.
14 Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
You shall prepare a meal offering with it morning by morning, the sixth part of an ephah, and the third part of a hin of oil to moisten the fine flour; a meal offering to the LORD continually by a perpetual ordinance.
15 Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile.
Thus they shall prepare the lamb, the meal offering, and the oil, morning by morning, for a continual burnt offering.”
16 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi.
“‘The Lord GOD says: “If the prince gives a gift to any of his sons, it is his inheritance. It shall belong to his sons. It is their possession by inheritance.
17 Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ.
But if he gives of his inheritance a gift to one of his servants, it shall be his to the year of liberty; then it shall return to the prince; but as for his inheritance, it shall be for his sons.
18 Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’”
Moreover the prince shall not take of the people’s inheritance, to thrust them out of their possession. He shall give inheritance to his sons out of his own possession, that my people not each be scattered from his possession.”’”
19 Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ.
Then he brought me through the entry, which was at the side of the gate, into the holy rooms for the priests, which looked towards the north. Behold, there was a place on the back part westward.
20 Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.”
He said to me, “This is the place where the priests shall boil the trespass offering and the sin offering, and where they shall bake the meal offering, that they not bring them out into the outer court, to sanctify the people.”
21 Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla.
Then he brought me out into the outer court and caused me to pass by the four corners of the court; and behold, in every corner of the court there was a court.
22 Nʼakụkụ anọ nke ogige ndị a, ogige ndị ọzọ dị nʼime ha. Ha ruru mita iri abụọ na atọ nʼogologo, ebe obosara ha rukwara mita iri na asaa nʼọkara. Ogige anọ ndị a ha nʼotu.
In the four corners of the court there were courts enclosed, forty cubits long and thirty wide. These four in the corners were the same size.
23 Nʼime ụlọ ahụ, gburugburu ya, e nwere ahịrị e ji nkume doo, nke nwere ekwu dị nʼokpuru ahịrị nkume ahụ.
There was a wall around in them, around the four, and boiling places were made under the walls all around.
24 Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ụlọ ebe ndị niile na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu ahụ ga-anọ na-esi ihe aja niile ndị mmadụ webatara.”
Then he said to me, “These are the boiling houses, where the ministers of the house shall boil the sacrifice of the people.”

< Izikiel 46 >