< Izikiel 4 >

1 “Ugbu a, gị nwa nke mmadụ, were otu ọkpụrụkpụ aja, tọgbọ ya nʼihu gị. Sepụtakwa obodo Jerusalem nʼelu ya.
“You also, son of man, take a tile, and lay it before yourself, and portray on it a city, even Jerusalem.
2 Seekwa ihe nnọchigide nʼagha megide ya, wuokwa ụlọ ndị agha gburugburu ya, wukọta ụlọ ikwu dị iche iche megide ya na ihe e ji akụdasị mgbidi ya niile.
Lay siege against it, build forts against it, and cast up a mound against it. Also set camps against it and plant battering rams against it all around.
3 Werekwa efere igwe debe nʼetiti gị na obodo ahụ dịka mgbidi e ji igwe wuo. Chee obodo ahụ ihu gị, ka ị chegide ya nke ọma nʼihi na ndị iro gbara ya gburugburu. Nke a ga-abụ ihe ama nye ndị Izrel.
Take for yourself an iron pan and set it for a wall of iron between you and the city. Then set your face towards it. It will be besieged, and you shall lay siege against it. This shall be a sign to the house of Israel.
4 “Ugbu a, dinara ala nʼakụkụ aka ekpe gị, aga m enye gị ntaramahụhụ mmehie ndị Izrel, ị ga-ata ahụhụ mmehie ha ụbọchị niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị.
“Moreover lie on your left side, and lay the iniquity of the house of Israel on it. According to the number of the days that you shall lie on it, you shall bear their iniquity.
5 Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel.
For I have appointed the years of their iniquity to be to you a number of days, even three hundred and ninety days. So you shall bear the iniquity of the house of Israel.
6 “Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-edina ala nke ugboro abụọ, ma ọ ga-abụ nʼakụkụ aka nri gị, ị ga-eburu ntaramahụhụ mmehie ndị Juda. Ọ bụ iri abalị anọ, otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ.
“Again, when you have accomplished these, you shall lie on your right side, and shall bear the iniquity of the house of Judah. I have appointed forty days, each day for a year, to you.
7 Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya.
You shall set your face towards the siege of Jerusalem, with your arm uncovered; and you shall prophesy against it.
8 Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo.
Behold, I put ropes on you, and you shall not turn yourself from one side to the other, until you have accomplished the days of your siege.
9 “Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri.
“Take for yourself also wheat, barley, beans, lentils, millet, and spelt, and put them in one vessel. Make bread of it. According to the number of the days that you will lie on your side, even three hundred and ninety days, you shall eat of it.
10 A ga-atụ ihe oriri gị atụ, nri nke ị ga-eri otu mgbe ga-abụ narị gram abụọ na iri gram atọ; naanị otu mgbe ka ị ga-eri nri nʼụbọchị.
Your food which you shall eat shall be by weight, twenty shekels a day. From time to time you shall eat it.
11 A ga-ekupụtakwa mmiri ị ga-aṅụ, ị ga-aṅụ mmiri naanị otu ugboro nʼụbọchị, otu udu mmiri e kere ụzọ isii.
You shall drink water by measure, the sixth part of a hin. From time to time you shall drink.
12 Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.”
You shall eat it as barley cakes, and you shall bake it in their sight with dung that comes out of man.”
13 Onyenwe anyị kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.”
The LORD said, “Even thus will the children of Israel eat their bread unclean, amongst the nations where I will drive them.”
14 Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.”
Then I said, “Ah Lord GOD! Behold, my soul has not been polluted; for from my youth up even until now I have not eaten of that which dies of itself, or is torn of animals. No abominable meat has come into my mouth!”
15 Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.”
Then he said to me, “Behold, I have given you cow’s dung for man’s dung, and you shall prepare your bread on it.”
16 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta.
Moreover he said to me, “Son of man, behold, I will break the staff of bread in Jerusalem. They will eat bread by weight, and with fearfulness. They will drink water by measure, and in dismay;
17 Aga m eme ka ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ kọọ ha. Ha ga na-elerịta onwe ha anya nʼoke egwu, ha ga-anwụkwa nʼihi mmehie ha.”
that they may lack bread and water, be dismayed one with another, and pine away in their iniquity.

< Izikiel 4 >